Ụlọikpe enyela iwu ka ejichie Gerald Irona onye bụbu osote Gọvanọ Imo Steeti na mkpọrọ.

Gerald Irona

Ebe foto si, Gerald Irona/Facebook

Ụlọikpe majie nke dị n'Owerre Imo Steeti enyela iwu ka anwuchie onye bụbu osote Gọvanọ Imo Steeti bụ Gerald Irona taa.

Nke a na-eme dịka akpụpụrụ ya ụlọikpe ma ọkaiwu ya bụ S.I Imo kwuru ka ọkwụọ ụgwọ ka ahapụ ya nwa mgbe nta dịka ọ bụ onye rụbuuru gọọmentị ọrụ kama ọkaiwu ndị gbara ya bụ ikpe bụ Sunday Ogbuji kwuru na ụlọikpe majie enweghị ikike inye iwu ka atọhapụ ya nwa mgbe nta ma sị na ọ bụ ọkaikpe ụlọikpe ukwu nwereike inye ya bụ ikike.

Akụkọ na-ekwu na a nwụchịrị ya n'ụlọ ya dị n'Owerre n'ihe dịka elekere 10:15 nke abalị n'ụbọchị Wenezde.

Ọkaikpe C. N Ezerioha kwetere na ya bụ okwu Ogbuji kwuru ma sị ka e jichie Irona n'ụloikpe.

Ebubo e boro ya bụ " na gị bụ Mazi Gerlad Irona na ndị ọzọ gbarala ọsọ ugbua n'ihe dịka ọnwa Jenụwarị afọ 2020, gbara mgba-okpuru maka gọọmentị Imo Steeti nke megidere iwu Naịjirịa nke afọ 2004 dịka iwu Imo steeti siri dị",

Ebubo nke abụọ a sị, "Na gị onwe gị kwuru okwu sị na ị ga-eme ka Imo steeti banye n'ọgbaghara ma sịe ike ọchịchị, kamgbe I kwuchara okwu a ka ndị omekome bidoro na-eyi ndụ egwu ma na-akpa arụ nke megidere iwu Imo steeti dịka iwu Naịjirịa nke afọ 2004 siri dị".

Nke ikpeazụ ekwuo sị, "Na gị onwe gị bụ Gerald Irona n'ụbọchị 15 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2020 na mpaghara ụlọikpe Owere weere ụgbọala land cruiser jeep ( V8 and v6) abụọ na otu Toyota Hilux nke ego ha ruru nde narị naịra anọ na iri itolu nke bụ nke gọọmentị Imo steeti ma jichie ya dịka ọ bụ nke gị, nke a megidere iwu nke Naịjirịa nke afọ 2004 dịka o siri metụta Imo steeti".

Ogige ụlọikpe

Onye bụ Gerlad Irona?

Gerald Irona bụ osote Gọvanọ Imo Steeti site n'ụbọchị 29 nke ọnwa Meị afọ 2019 ruo ụbọchị 14 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2020 tupu ụlọikpe ekwuo ka ewepụ emeka Ihedioha n'ọchịchị ma tinye Uzodinma dịka Gọvanọ Steeti ahụ.