Ana m azọ ọkwa Gọvanọ ka m gbanwee ọnọdụ ndụ ndị Abia - Onyekwere A. Uche
- Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Ebeg o si, Umuahia, Abia Steeti
Onyekwere Akym Uche bụ onye na-azọ ọkwa Gọvanọ Abia steeti na pati Action Alliance (AA) ekwuola na ya ga-eji ihe ọ mụtara na mba ofes ebe o biri ọtụtụ oge wee gbanwee ndụ ndị Abia ma ọ bụrụ na o merie.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere nwa amadị a e ji OAU mara kwuru na ọ na-ewute ya etu ọtụtụ mmadụ n'Abia steeti si ata ahụhụ n'ihi gọọmentị akwụghị ndị ọrụ na ndị lara ezumike ụgwọ, enweghị ezi ahụike, na ihe ndị ọzọ.
Mazị Uche gụrụ akwụkwọ na Mahadum Abia Steeti dị n'Uturu ebe o nwetara ọzụzụ na ngalaba 'Economics', tupu ọ gaa mba ofesi ma nweta ọzụzụ na ngalaba nrụpụta ụgbọala.
"Achọrọ m inye ụmụaka ndị nne na nna ha abụghị ọgaranya dị ka m, ohere inweta agụmakwụkwọ, ma nye ha olileanya na ha nwereike ịbụ ihe ọbụla ha chọrọ ịbụ na ndụ ha," Uche kwuru.
Gere mkparịtaụka a n'uju n'onyonyo a.







