Autism egbochighi nwa m ịbụ ide ego n'afọ 17
Christine Nnaji, 17, bụ nwaada Igbo gbara afọ ise nwere ngwarụ Bekee kpọrọ Autism.
Autism gosiputara na ndụ ya mgbe ọ gbara afọ atọ,3, mana ọ hịara ahụ nne ya na nna ya ikweta na ọ nwere ụdịrị nkwarụ a.

Onye bụ ọkachamara n’Autism bụ Helen Aninkwoi sị na Autism abụghị ọrịa, “kama ọ bụ ebumpụtaụwa”.
Nne ya bụ Nonye Mike Nnaji sị na “ha mere ihe niile ịchọta enyemaka n’ahụ Christine mana enyemaka adịghị nso”.

Christine bụ nwa nke abụọ ya, bụrụkwa otu nwaanyị nọ n’ezinụlọ ahụ. Otu nwoke tọrọ ya, ọ tọọ nwoke ọzọ. Ụmụnwoke abụọ ahụ dịcha mma, ọnweghị ihe na-eme ha.
Ọ nyere nne ya na nna ya nsogbu nke ukwuu ịhụ na otu nwanwaanyị ha nọ na ụdị ọnọdụ ahụ.
Nonye sị na ebụmnobi ha bụ ka Christine bụrụ Dọkịnta Bekee, mana obi gbawara ha ịhụ na Christine ekwughị ekwụ ma ya fọkwa ịka aka. Nke a gbagwojuru nne na nna ya anya.
Nonye sị na ha tinyere nụkwụrụ nụ ego n’isi Christine mana ọnweghị isi.
Ha bidooro ya akwụkwọ mana ọnweghị ihe ọ na-amụta maka na ọ naghị ekwu okwu nke ọma.

Naanị ihe Christine na-eme bụ ise ihe dịka mmadụ nwere mpị n’akwụkwọ agụmagụ ya niile.
Hellen sị na Christine kọwara ya bụ eserese dịka nwamba kwụ ọtọ.
Ka o ruru afọ iri na isi, mgbe nje coronavirus ji ndị mmadụ n’ụlọ, Christine enweghị ike iso ibe ya na-agụ akwụkwọ “online” maka ngwarụ a.

Nne ya na nna ya gara kpọtara ya onye nkuzi n’ụlọ ga-akuziri Christine eserese.
Ya bụ nwaadị meghere anya Christine nke bụ na ọ malitere ịse ihe nke bụ na ọtụtụ mmadụ na-ego eserese ya okeọnụ.
Christine agaala ngosi na-ebe dị icheiche ritakwa uru dị na ya.
Ugbua, Christine na-ekwutu okwu nwantịị.
Nne ya sị na, “Christine kacha ụmụnne ya ndị ahụ siri ike akpata ego.

Ego ọ na-enweta n’eserese ya ka ndị be ha jiri meghere ya ụlọọrụ na-elekọta ndị nwere ụdịrị nkwarụ a.
Helen Aninkwoi sị na ọ dị mma nne na nna ịlebere ụmụ ha anya mgbe ọ dị na nwata iji mara ka ha e nwere nsogbụ Autism. Ọ kọwakwara ka e sị amata ya bụ ọnọdụ na ebe e kwesịrị ịga nweta enyeaka.
Kiria ya n’uju.



