Etu ihe esere si enyere Aziza nwata nwere 'Autism' aka

Aha onyonyo, Akụkọ maka Autism Spectrum Disorder

Nne na nna Aziza,nwata nwere 'nsogbu 'Autism Spectrum Disorder bụ ASD n'ịchafụ kọwara etu nwa ha na ọnọdụ ahụ si aga.

Ngalaba WHO kọwara ASD dịka ọnọdụ dị iche iche nke na-egosipụta site n'ịme ka mmekọrịta na ụzọ ịkparịta ụka n'ụzọ dị iche iche siere mmadụ ike.

N'aka nke ọzọ ka ngalaba na-ahụ maka ahụike mba Briten bụ National Health Service bụ NHS n'ịchafụ kwuru na ASD abụghị ọrịa ma ncha.

Akụkọ a bụ maka Aziza bụ nwa nere ọnọdụ ASD.

Ha kwuru ihe ịma aka nwa ha na enwe

Nwa ha nwere ihe bekee na-akpọ Autism Spectrum Disorder.

Njirimara ASD

Dịka Eziafakakụ Nwokolo onye na-ahụ maka agwa kọwara ụfọdụ ihe eji amara onye nwere ọnọdụ ASD -

1) O kwuru na nke mbụ bụ na onye ahụ agaghị enwe ike ile mmadụ ọzọ anya na mkpụrụ anya

2) Nwokolo kwuru na ọzọ bụ na ha anaghị anọ otu ebe

3) O gụnyere na ụfọdụ anaghị ekwe aza aha ha maọbụ nwee mmekọrịta ha na mmadụ ọzọ

4) O si kwa na ụfọdụ ụmụaka nwere ya anaghị enwe ike iji ihe ụmụaka ibe ha ji egwu egwu.