A ga-edu Bola Tinubu n'iyi ọrụ agbanyeghị ikpe a gbara maka ya - Lai Mohammed

Ebe foto si, Getty Images
Mịnịsta na-ahụ maka mgbasaozi bụ Lai Mohammed ekwuola na a ga-edu Bola Ahmed Tinubu n'iyi ọrụ dịka onyeisiala Naịjirịa n'ụbọchị 29 nke ọnwa Mee afọ 2023 agbanyeghị ikpe ndị a gbara maka ya.
Nke a na-eso dịka otu dị iche iche na-ekwu ka ehiwe ọchịchị nwa mgbe nta n'ihi na etu e siri mee ntuliaka nke ụbọchị 25 nke ọnwa Febụwarị afọ 2023 ejughị ha afọ.
Mohammed kwuru na enweghị ebe iwu kwadoro maka ọchịchị nwa mgbe nta.
O kwuru na ndị patị na-anọghị n'ọchịchị nwere ikike ị ga ụlọikpe maka mpụtara ntụliaka.
Mmadụ anọ ndị soro zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa gara ụlọikpe n'ihi ka kwuru na nrụrụaka juputara na ntuliaka ahụ e mere.
Dịka o siri dị, ụlọikpe na-eji ọnwa asatọ ekpebi maka ihe gbasara ntuliaka onyeisiala.
A ga-anụ ihe gbasara akwụkwọ a gbara n'ime ụbọchị 180 site n'ụbọchị a gbara ya bụ akwụkwọ.
Onye ikpe a ejughị afọ nwere ụbọchị 21 ị ga ụlọikpe mkpesa nke ga-ekpe ya bụ ikpe n'ime ụbọchị 60.
Ọ bụrụkwa na o jughị ha afọ, ha nwere ụbọchị 21 ị kpesa n'ụlọikpe kachasị nke bụ ekwusịa ọgwụ maka ikpe ahụ.
Ka Peter Obi gwa anyị ma mkparịtaụka ya na Oyedepo ọ mere ka omeghị - Lai Mohammed

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Mịnịsta mgbasaozi Naịjirịa bụ Lai Mohammed agwaala Peter Obi onye ji ọkọlọtọ otu Labour Party zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa 2023 ka ọ kọwara ndị Naịjirịa ihe ọ pụtara mgbe o kwuru na 'mkparịtaụka ya na David Oyedepo bụ onyeisi ụka Living Faith bụ akụkọ ụgha'.
Mohammed kwuru nke a dịka ya na ndị ntaakụko nwere mkparịtaụka na Lọndọn nke mba Briten ma kwuo:
"A chọrọ m ka ndị Naịjirịa tinye uche maka mkparịtaụka dị n'etiti Peter Obi nke Labour Party na ụkọchukwu".
"Ya bụ mkparịtaụka ekpughere ebe Obi na-arịọ ụkọchukwu ka ọ rịọ ndị okpukperechi nke Kraịst ka ha tụnyere ya n'ihi na ọ bụị agha okpụkperechi ka a na-alụ, ma sị ka ha kwado ya ".
O kwuru na dịka Obi bịara kwuo na ya bụ mkparịtaụka pụtara ihe bụ adịgboroja ma bụrụkwa akụrụakụ.
O kwuru sị, "Ọ bụrụ na ọ bụ adigboroja, ya bụna ọmeghị. Ọ bụrụ na ọ bụ akpụrụakpụ, nke a pụtara na ya bụ nkata mere kama na aka nkịta nọ ya".
" Ọ bụrụ na ọ bụ akụrụakụ, kedụ nke bụ akpụrụakopụ na ya bụ ntụliaka".
"Ọ bụ mgbe ọ zara sị, 'Yes Daddy' ka ọ bụ mgbe o kwuru maka 'Agha okpukperechi' bụ nke akụrụ akụ".
Lai Mohammed kwuru sị, "Maka nke a, Naịjirịa ekewaala karịa etu ọ dị na mbụ dịka ndị mmadụ na-ekwuzi okwu maka isiokwu a site na okpukperechi na agbụrụ ha sị".
Ihe mere Peter Obi ji kwuo na ọ ga-ebuga okwu a ụlọikpe

Peter Obi na nso nso a sara okwu ebubo olu ya a sị dapụtara na soshal midia nke ọtụtụ na-arụ ya aka na o kwuru na ntuliaka 2023 bụ ‘agha metụtara okpukperechi’.
N’ozi Obi bipụtara n’akara Twitter ya n’abalị Wenezde, o kwuru gọpụrụ onwe ya n’olu a dapụtara na soshal midia ma kwuo na ọ ga-akpụkpụ ụlọ ntaakụkọ kesara ya bụ Peoples Gazette ụlọikpe maka okwu ntetọ aha n’ọha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
O kwuru:
“Atụmatụ ndị a na-eme iji megharịa ndị Naijiria dị nnọọ mwute ma bụrụ ajọ omume. A gwala ndị otu iwu anyị ka ha buru okwu a gaa ụlọikpe megide Peoples Gazette na ndị ọzọ.”
Peoples Gazette sara okwu a n’ọba ozi ha kwụsieike na akụkọ olu ahụ dara nke Obi na David Oyedepo abụghị akụkọ ụgha dịka ha rụrụ Obi aka ka o kwuo ihe mere o kwughi okwu banyere olu ahụ ha kesara ka abalị olemole gachara.
Ha kwukwara na ha kpọturu ya na ndị mgbasaozi ya oku ka ha zara ọnụ ha n’okwu a mana ha asaghị.
“Ụlọọrụ Gazette kpọturu ndị ọrụ mgbasaozi obi maka olu ahụ dapụtara. Ndị ọrụ ya nke gụnyere Valentine Obienyem, Mike Ifedi nakwa onyeisi achụmnta vootu ya bụ Akin Osuntokun enweghi tinye ọnụ n’okwu a”
Ha gara n’ihu kwuo na mmadụ abụọ na-arụrụ Obi kwetere na ya bụ olu dapụtara abụghị akụkọ ụgha.

Ha abụọ ha kpọrọ n’okwu a bụ Kenneth Okonkwo na Maazị Obienyem bụ onye ha kwuru gbaama na ya bụ olu bụ nke ezie n’ụbọchị abụọ nke ọnwa Eprel.
N’aka ọzọ, Omoyele Sowere zọọrọ African Action Congress (AAC) ọkwa onyeisiala 2023 saara Obi n’ụbọchị isii nke onwa Eprel n’okwu mkpụpụ ụlọikpe a o kwuru ọ ga-eme megide Peoples Gazette ma kwuo:
“Mmaja a Obi na-eme nke kwuru na ọ ga-ebuga okwu a ụlọikpe ga-abụ ihe kacha njọ obi ga-eme...”
“Onye ọkaiwu ka dị obere n’ọrụ sị ụlọakwụkwọ ndị ọkaiwu pụta taataa ka awụ Obi bụ onye ọtụụ asị n’ala n’ụlọikpe”
“A kwụdooro m Peoples Gazette, a chọrọ ka ha ghara ịtụ ụjọ n’okwu a n’ihi na ama m na ọ bụ egbe ọnụ ka ọ na-agba, ọ gaghị a kpụpụ ha ụlọikpe”
Ozi obi zipụtara metụtakwara ebubo ndị ọzọ nke na-akpọtụ na soshal midia kemgbe ọ kachasị dịka o kwuru na e nwere ndị na-agba mbọ ịchụpụ ya Naịjirịa ugbua.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2

Ebe foto si, Peter Obi/Twitter
Ihe ndị ọzọ Obi kwuru n'ozi ya
Obi kwuru:
"Mbọ otu APC na gọọmentị APC , site n'aka ndị ọrụ gọọmentị na ngalaba dị iche iche bụ iji megharịa anyị anya maka etu e siri napụ anyị mpụtara ntuliaka dị nọọ mwute. Ha ji ụzọ dị iche iche nke gụnyere okpotokpo asị na ebubo nke sitere n'ọnụ mịnịsta mgbasaozi bụ Lai Muhammed, nkesa nkata akpara na-ekwe ntị nke bụ adigboroja ya na mbọ ime ka m si Naịjirịa gbapụ".
O kwuru ma kwusie ike sị, " Nkata ekwentị a na-efegharị bụ adigboroja...enweghị mgbe m jiri kwuo maọbụ rụtụ aka na ntuliaka 2023 bụ agha okpukperechi".
Obi kwukwara na ndị ọkaiwu ha adịla njikere ịkpụpụ ụlọ ntaakụkọ Peoples Gazette na ndị ọzọ ụlọikpe maka mkparịtaụka ekwentị adigboroja a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Mkparịtaụka Peter Obi na David Oyedepo adaghị iwu - Kenneth Okonkwo

Ebe foto si, Bishop Oyedepo/Peter Obi/Twitter
Kenneth Okonkwo bụ ọnụ na-ekwuru Peter Obi ekwuola na onyonyo mkparịtaụka nke dị n'etiti Peyer Obi na Bishọp David Oyedepo, bụ nke na-efesa na soshal midia ugbua, adaghị iwu ọbụla.
O kwuru nke a dịka ọtụtụ ndị mmadụ na-eche na mkparịtaụka ahụ nke ụlọ ntaakụkọ 'Peoples Gazette' wepụtara, bụ adigboroja, mana nkọwa Kenneth Okonkwo nyere gosiri na ya bụ mkparịtaụka mere eme.
Peter Obi bụ onye ji ọkọlọtọ Labour Party zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka e mere n'ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị 2023.
Na mkparịtaụka ahụ, nke a sị mere otu ụbọchị tupu ụbọchị ntuliaka, a nụrụ ebe Obi na-agwa Oyedepo okwu gbasara ntuliaka ahụ.
Peter Obi n'onwe ya maọbụ Oyedepo n'onwe ya ekwubeghị ihe ọbụla gbasara mkparịtaụka a bụ nke malitere ifesa na soshal midia n'ụbọchị Satọde, bụ ụbọchịmbụ nke ọnwa Eprel 2023.
"Ịrịọ nkwado na ntuliaka abụghị ịkpọ oku agha"

Ebe foto si, Kenneth Okonkwo
Kenneth Okonkwo kọwara na ọ bụ "ndị ndọrọndọrọ ọchịchị bụ ekprima" na-achọ ịtụgharị mkparịtaụka ahụ dị n'etiti Peter Obi na Oyedepo ka ọ dị ka ọ bụ okwu gbasara okpukperechi.
"Ihe Bishọp Oyedepo kwuru doro anya na 'Ndị Naịjirịa niile ketara oke nhatanha na n'obodo a, onweghị onye ga-ekwu na ọ na-emenyere ibe ya," Okonkwo dere.
"Peter Obi na-arịọ ụkọchukwu Oyedepo ka o nyere ya aka gbasaa ozi a gwa mmadụ niile nakwa ndị okpukperechi Christ, n'ihi na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-eso achụmnta vootu ka a ga-asị na ọ bụ agha okpukperechi."
"Iji kọwaa ya nke ọma, Obi gwara Oyedepo na ya agaala ga leta eze ọdịnala obodo Offa, bụ Olofa nke Offa, onye bụ muslim, mana o nyere ya ndụmọdụ ka ọ gaa nata nkwado Oyedepo. Onwebeghị onye ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla gara kpọtụrụ Olofa nke Offa."
"O doro anya na APC, nke bụ otu ndọrọ ọchịchị nke onye na-azọ ọkwa onyeisiala, osote ya, onyeisi Sineti, onyeisi ụlọ omeiwu nta, osote onyeisi ụlọ omeiwu nta, na onyeisi pati ha sicha n'okpukperechi muslim, n'oge onyeisi ọkaikpe bụkwa onye muslim, bụ ha bụ pati maliterela agha okpukperechi na Naịjirịa."
Kenneth Okonkwo gara n'ihu kwuo na ya so Peter Obi gagharịa mpaghara Naịjirịa niile n'oge ọ na-achụ nta vootu, "ahụtụbeghị m ya ka ọ kpasoro mmadụ ọbụla oke n'ihi okpukperechi ya. O nweghị ike ime nke ahụ n'ihi na osote ya bụkwa onye muslim".
Okonkwo gwara ụmụ Naịjirịa ka ha ghara ige ntị n'ebubo ịkpa oke okpukperechi nke a na-ebo Peter Obi n'ihi mkparịtaụka ya na Oyedepo bụ nke pụtara ihe ugbua.
Ihe dị n'ime mkparịtaụka ahụ
N'ime mkparịtaụka ahụ nke BBC nụrụla mana amatabeghị ma o bụ adịgboroja ma ọ bụghị, a nụrụ ebe Obi kwuru sị "Daddy, achọrọ m ka ịgwa ndị nke gị na mpaghara South-West na Kwara, ndị otu Christ na mpaghara South West na Kwara."
Ọ gara n'ihu kwuo na "nke a bụ agha okpukperechi", nke Oyedepo zaghachiri sị "ekwere m ya, ekwere m ya, ekwere m ya".
Obi kwukwara sị, "ọ bụrụ na ọ gazie, nkwado ụnụ agaghị abụ ihe lara n'iyi". Bishọp Oyedepo zaghachi sị, "Anyị na-ele anya enyemaka Chukwu".
Ụgha na aghụghọ ndị APC akarịala - Labour Pati
Otu n'ime ndị na-ekwuchitere otu achụmnta vootu nke Peter Obi na osote ya bụ Yusuf Datti Baba-Ahmed, bụ Diran Onifade, wepụtara akwụkwọ ozi gbasara onyonyo mkparịtaụka a nke na-efegharị, ma kwuo na "aghụghọ nakwa okwu ụgha nke ndị APC ga-akwụsịrịrị ugbua".
"Ebe anyị na-agbaso usoro iwu nke bụ ịga ụlọikpe iji nwetaghachi mmeri anyị, otu APC na-aga n'ihu n'iji ụzọ aghụghọ niile, na okwu ụgha iji jigide ihe na-abụghị nke ha," Onifade dere.
"Bido n'ihe ihere mere na Port Harcourt, ruo na ejije mere n'ụgbọelu Ibom Air, wee ruo na nke ugbua ha wepụtara mkparịtaụka adịgboroja iji kwalite ọgbaaghara okpukperechi."
"Ihe ndị a niile bụ ihe ha na-eme iji metọọ aha Peter Obi ma mee ka ndị mmaọ̄ụ ghara ịtụkwasị ya obi, mana ha adaala."
"Ugboro ugboro ka Peter Obi kpọrọla oku ka ndị Naịjirịa hapụ ịtụrụ ya vootu n'ihi okpukperechi maọbụ agbụrụ o si."
"Anyị na-agwa ụmụ Naịjirịa ka ha kwụsie ike dịka anyị na-agba mbọ iwetaghachi mmeri ka Peter Obi na Datti Baba-Ahmed site n'ụzọ iwu kwadoro."
Atụmatụ Peter Obi ịbụ onyeisiala Naịjirịa anwụọla - Festus Keyamo

Ebe foto si, Channels TV
Ọnụ na-ekwuru otu achụmnta vootu nke ndị APC bụ Festus Keyamo etinyela ọnụ n'ebubo ịkpa oke okpukperechi a na-ebo Peter Obi.
Keyamo, onye bụkwa Mịnịsta nta na-ahụ maka ndị ọrụ na Naịjirịa, kwuru sị: "Dịka anyị matarala na onyonyo mkparịtaụka Peter Obi bụ eziokwu, ndị ikpe kacha ma bụ ndị na-akpọ onwe ha ndị ụkọchukwu mana ha na-agbachi nkịtị ka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị jiri ha na-amụnye ọkụ ọgbaaghara ịkpa oke okpukperechi n'aha ndọrọndọrọ ọchịchị."
"Nke a pụtara na mgbe ndị ụkọchukwu a na-ekwu na ha nụrụ olu Chukwu, ihe ha nụrụ bụ olu Peter Obi, ọ bụghị olu Chukwu. Nke a bụ aghụghọ ma bụrụkwa ihe ihere na-asọ oyi."
"Maka Peter Obi onye na-ekwu maka "agha okpukperechi" n'obodo ebe e nwere otu okpukperechi dị icheiche, ezi Chineke egosila ụwa niile onye ọ bụ n'ezie, nrọ ya na atụmatụ ya niile ịbụ onyeisiala Naịjirịa anwụọla pịị," Keyamo dere.
Onyonyo ahụ bụ adigboroja - Ndị nkwado Peter Obi

Ebe foto si, Twitter Screebgrab
Ọtụtụ ndị a ma ama na-akwado Peter Obi na soshal midia - a na-akpọ 'Obedients' - kwuru na onyonyo ahụ na-egosi mkparịtaụka Peter Obi na Oyedepo bụ adịgboroja.
Otu n'ime ha e ji Uncle Charles mara kwuru na ọ bụ akụrụngwa 'Artificial Intelligence' (AI) ka e ji megharịa ihe yiri olu Obi na Oyedepo.
Onye ọzọkwa aha Twitter ya bụ @firstladyship kwuru na Kenneth Okonkwo na-ekwuru onwe ya na nkọwa ahụ o nyere.

Ebe foto si, Twitter Screengrab








