Adedeji Odulesi: Lee nwoke Ijebu ji asụsụ Igbo na ndị ọzọ akwalite ịdịnotu Naijiria

Aha onyonyo, Adedeji Odulesi: Lee nwoke Ijebu ji asụsụ Igbo na asụsụ ndị ọzọ akwalite ịdịnotu Naijiria

Naijiria bụ mba nwere ọtụtụ agbụrụ nakwa asụsụ. Ndịiche dị n'asụsụ nakwa omenala agbụrụ niile dị na Naijiria kwesịrị ịbụ nnukwu uru ọbụghị ọghọm.

Nke a bụ ihe Mazị Adedeji Odulesi kwuru, mere ya ji eji onyinye ịsụ asụsụ atọ a kacha mara na Naijiria, bụ Awụsa, Igbo na Yoroba, na-akwalite ịdịnotu na ezi mmekọrịta n'etiti ụmụ Naijiria.

Odulesi, bụ onye Ijebu dị n'agbụrụ Yoroba, mana ọ na-asụ asụsụ Igbo na Hausa nke ọma, tinyekwara asụsụ French, Jaman, na Pijin English.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ọdịnso a, Adedeji kọrọ etu o si mụta Igbo site n'aka onye ntụgharị asụsụ n'ụlọuka Deeper Life, n'Owere, Imo Steeti, n'afọ 1991/92.

Taa, ọ bụ asụsụ Igbo na asụsụ ndị ọzọ ọ na-asụ, ka o ji enye ezinụlọ ya nri, dịka onye na-ekwu okwu na mmemme, nke bekee na-akpọ 'Master of Ceremony' (MC), ma jirikwa ya na-akwalite ịdịnotu Naijiria.

Adedeji Odulesi
Nkọwa foto, Adedeji Odulesi

Ọ na-eme nke a site n'ịchọta ndị na-asụkwa ọtụtụ asụsụ Naijiria dịka ya onwe ya, na-agba ha ajụjụ ọnụ gbasara agbụrụ Naijiria dị icheiche na ihe ọma gbasara agbụrụ ndị a.

"Ọ bụrụ na ị hapụbeghị mpaghara gị gaa ebe ọzọ, hụ omenala ndị ọzọ, ị ga na-asị na ndị nke a bụ ndị ọjọọ, ndị nke ọzọ kpọrọ anyị asị," Odulesi kwuru.

"Mana site na mkparịtaụka mụ na ndị Naijiria si agbụrụ dị icheiche, amatala m n'ezie na ụmụ Naijiria hụrụ onwe anyị n'anya."

"Ya mere m ji egosipụta onyinye a m nwere, nke bụ ịsụ asụsụ dị icheiche, iji mee ka nghọtahie, ogbaaghara na akpọmasị nwụọ n'obodo Naijiria."

Odulesi sị na ya enyela onwe ya aha Igbo, nke bụ Chukwuemeka, nyekwa nwa ya nwaanyị aha Igbo - Chioma, ebe aha Igbo nwa ya nwoke bụ Chinedu.

Gere akụkọ a n'uju n'onyonyo dị n'elu.