Imi, ewu, na okwu ndị yiri onwe ha n’asụsụ Igbo na Yoruba

Asụsụ Igbo na asụsụ Yoruba so na'asụsụ ndị na-asụ ha kacha n’ọnụọgụgụ na Naịjirịa.
A bịa n’usoro ọmụmụ sayensị asụsụ dị icheiche, asụsụ Igbo na asụsụ Yoruba so n’otu a na-akpọ ‘Niger-Congo Language family’.
A bịa n’ime otu a bụ ‘Niger-Congo Family’, e nwekwara otu itoolu ọzọ dị na ya, nke otu n’ime ya bụ ‘Benue-Congo’, Yoruba na Igbo so n’otu nke a.
Ihe nke a pụtara bụ na asụsụ abụọ a yitere onwe n’ụzọ dị icheiche, dịka ụdaolu (tone), mkpọnimi (nasality), ndakọ ụdaume (vowel harmony), na ihe ndị ọzọ.
Mana n’ụzọ pụrụiche, asụsụ Igbo na Yoruba nwere ọtụtụ mkpụrụokwu dị na ha nke mpụtara ha bụ otu ihe maọbụ yiri otu ihe.
Nke a mere ka ụfọdụ ndị ọkachamara n’ọmụmụ asụsụ na-ekwu na Igbo na Yoruba bụbu otu asụsụ puku kwuru puku afọ gara aga, mana ọ bụ dịka afọ na-agafe, a na-enwe mgbanwe n’asụsụ abụọ a ruzie nke na ha abụọ bụzị asụsụ abụọ nọọrọ onwe ha.
Ụfọdụ mkpụrụokwu Igbo na nke Yoruba yiri onwe ha na mpụtara

Amen – Ise (Igbo); Ase (Yoruba)
Ear – Ntị (Igbo); Eti (Yoruba)
Mouth - Ọnụ (Igbo); Ẹnu (Yoruba)
Nose – Imi (Igbo); Imu (Yoruba)
Melon – Egwusi (Igbo); Egusi (Yoruba)
Stone – Okwute (Igbo); Okuta (Yoruba)
Shea Butter – Ori/Okuma (Igbo); Orii (Yoruba)
Twin – Ejima (Igbo); Ejire/Ibeji (Yoruba)
Deity – Olisa (Igbo); Orisha (Yoruba)
Divination – Afa (Igbo); Ịfa (Yoruba)
Python – Eke (Igbo); Ere (Yoruba)
Goat – Ewu (Igbo); Ewure (Yoruba)
Elephant – Enyi (Igbo); Erin (Yoruba)
Igbo na Yoruba ha abụbu otu asụsụ?

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Dịka edepụtara na mbụ, ụfọdụ kwenyere na ọ bụ otu nnukwu nna mụrụ agbụrụ Igbo na Yoruba, nke pụtara na asụsụ Igbo na Yoruba bụbu otu asụsụ ọtụtụ afọ gara aga.
Bolaji Aremo, bụ ọkammụta n’asụsụ English na Mahadum Obafemi Awolowo dị n’Ile-Ife Osun Steeti, kwupụtara echiche a na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ Punch nwere n’afọ 2019.
“Ọ bụrụ na mba abụọ na-asụbu otu asụsụ bịa kewaa ọtụtụ oge na-enweghị ike ị na-enwe mkparịtaụka, mba abụọ a ga-amalite inwe ndịiche dị icheiche n’etu ha si asụ asụsụ ha,” Ọkammụta Aremo kwuru.
“Ọ gachaa ọtụtụ oge, olundị abụọ a nnwereike gbanwee kpamkpam bụrụzie asụsụ abụọ... Asụsụ Yoruba na Igbo bụbu olundị dị n’otu asụsụ ọtụtụ afọ gara aga, mana ha aghọọla asụsụ abụọ dịwaga iche ugbua, n’ihi na ndị na-asụ ha anaghịkwa aghọta onwe ha. Asụsụ mụrụ ha bụ 'proto-Yoruba/Igbo language’ adịghịzi ugbua.”
Mana nkwenye a abụghị ozurumba ọnụ, enwekwara ndị ọkachamara kwenyere na asụsụ abụọ dịwagara onwe ha iche kamgbe chi si kee ha, kama ọ bụ n'ihi mbite okwu ka ha ji nwee mkpụrụokwu yitere onwe ha.









