Igbo culture and animal Totems: Etu Igbo si ahụta ugo,ngwere, nwamba na anụmanụ ndị ọzọ n'omenala Igbo

Ngwere na ugo

Ebe foto si, Getty Images

E nwere ọtụtụ anụmanụ dị n'ala Igbo ma nwekwa ihe ha na-egosipụta maọbụ nkwenye ndị Igbo nwere maka ha.

Igbo kwenyere na anụmanụ nille nwere ihe mmụọ ha na-egosi nke mere ha ji efe ụfọdụ ma na-asọ ụfọdụ nso.

Lee ụfọdụ n'ime anụ ndị a na ihe ha na-egosipụta:

Nwamba abụ amosu?

Nwamba

Ebe foto si, Press Association

Nwamba nke ụfọdụ na-akpọ nwaologbo bụ anụ ụlọ nke ụfọdụ ji mere enyi.

Mana dịka onye omenala Igbo doro anya bụ Eddy Ngene si kwuo, n'ala Igbo, Igbo na-ahụ nwamba dịka amosu.

"Ndị Igbo hụtara nwamba dịka amosu n'ihi na ha nwere nkwenye na mmụọ ọjọọ na-eji nwa ologbo akpaso mmadụ ike."

Nwamba

Ebe foto si, Adline Okere

Ọ bụghị nanị ndị Igbo na-ahụta nwamba dịka amosu, agbụrụ ndị Yoroba, ndị ọzọ dị n'Afrika na Asia e ji ajọ anya ele nwamba.

Mana dọkịta ụmụanụmanụ Dọkita Chidiebere Ubachukwu, onye nkuzi ngalaba nleta ahụike Anumanu na mahadum 'University of Nigeria Nsukka' kwuru na "o nweghị sayensi kwadoro nkwenye ahụ".

Dkta Ubachukwu gara n'ihu kọwaa sị, "Etu anya nwamba dị, agwa ya dịka ọ na-anọpụrụ onwe ya, mere ndị mmadụ ji asọ ya asọ."

Ngwere na-egosi aka ịdị ọcha

Lizard

Ebe foto si, Getty Images

Igbo na-ahụtara ngwere dịka anụ anaghị emebiri mmadụ ihe.

Nwangenesịrị, "Ngwere anaghị emebi ihe mmadụ kọrọ n'ubi.

"Ọ naghị emebi ihe mmadụ dosara n'ụlọ.

"Ọ bụ anụ na-akpara onwe ya nke mere Igbo ji asị na 'aka onye dị ọcha dịka aka ngwere'."

Edi dịka anụ arụsị ji aga ọgụ

Edi

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Ụfọdụ ndị Igbo na-akpọ onye ịrahụ ụra na-atọ oke ụtọ "edi abalị"

Edi bụ anụ na-ebi n'ọhịa nke Bekee kpọrọ, "Civet".

A ma edi dịka anụmanụ nwere ike ihi ụra ogologo oge nke mere Igbo ji asị onye na-arahụ oke ụra, " Ị na-arahụ ụra ka edi."

N'ihi na edi adịghị gara gara ka agụ, ọ na-eji ndende deta anụ ọ chọrọ igbu nke mere e ji ahụ ya dịka anụ na-aghọaghụọ." Nke mere onye aghghọ a na-akpọ ya'edi aghụghọ."

Ụfọdụ obodo n'ala Igbo na-eri anụ edi mana ụfọdụ na-asọ ya nsọ.

Dịka Nwangene kọwara n'Igbo na-ahụ edi anụ nso, anụmanụ mmụọ ji aga.

Ọ sịrị na, "Ọtụtụ arụsị dị n'ala Igbo nwere edi abalị ha ji aga ọgụ."

"Ọtụtụ obodo n'ala Igbo anaghị eri maọbu gbuo edi abalị n'ihi na ha na-ahụ Edi abalị ka anụ mmụọ."

Ọtụtụ mpaghara anaghị egbu maọbụ rie edi.

Agwọ nọ n'akịrịka

Agwọ

E nwere ọtụtụ agwọ di iche iche dịka akaege, ubi, ajụala, agwọ ojii na ndị ọzọ.

Dịka Nwangene siri kọwaa, ndị Igbo kwenyere na agwọ bụ anụ arụsị nwe."

Ndị Igbo na-akwanyere agwọ ugwu ma na-asọ ụfọdụ nso.

Iji maa atụ, e nwere ndị na-asọ eke, nwee ndị eke bụrụ nnukwu anụ oriri.

Eke

Ebe foto si, Getty Images

Nwangene kwuru na ụfọdụ agwọ ndị a anaghị ata ata n'obodo ndị na-akwanyere ya ugwu, ebe ha na-ata n'ebe ndị ọzọ.

"E nwere agwọ a na-akpọ akaege, na-acha akwụkwọ ndụ, akwụkwọ ndụ."

Ọ naghị ata ata, mana o nwere obodo ndị ọ na-ata ata.

"E nwere ndị anaghị egbu eke, nwee ndị na-egbu eke."

"E nwere ndị anaghị egbu ubi, nwee ndị na-egbu ya...wdg"

Ọ gara n'ihu kwuo na "ndi Igbo kwenyere na arụsị ji agwọ eje ọgụ.

"Ndị Igbo kwenyere na agwọ anaghị ata mmadụ na nkịtị. Onye ọbụla agwọ tara nwere ihe o metara."

"Ọ bụrụ na agwọ na-ata mmadụ na nkịtị, ndị niile na-awa n'ọhịa akara ịnwụcha n'ihi na ugboro ugboro ka a na-azọ agwọ ọkpa n'ọhịa mana ọ naghị ata anyị."

Agụ na-egosi dike

Agụ

Ebe foto si, Getty Images

Hapụ ndọrọndọrọ nke bụ nke n'etiti agụ na ọdụm ka anyị kwuo ihe agụ na-egosi n'omenala Igbo.

Agụ nke Bekee kpọrọ 'Leopard' bụ anụ na-ebi n'ọhịa e ji ịkpa ike mara.

Agụ bụ anụ na-acha agwa edo na ojii, na-akpa nanị onwe n'abalị mana ụfọdụ ọ na-apụta n'ehihie anyara anwụ.

Igbo na-ahụta agụ dịka eze ụmụ anụmanụ.

Nke mere ndị Igbo ji akwanyere ya ugwu pụrụ iche.

Nwangene sịrị, "Agụ bụ dịke nke mere onye ọbụla na-akpa ike a na-akpọ ya 'Omekaagụ' 'Obiagụ'."

'Ugo mara mma mana ọ na-eri awọ'

Eagle

Ebe foto si, Getty Images

Ugo bụ eze nnụnụ. Ọ bụ anụ siri ike dịka agụ.

E ji ugọ ama atụ dị iche iche na nghọta ndị igbo;mma,isi ike nakwa inwe mma ahụ ma na-eri ihe mmadụ na-asọ oyi.

Nwangene kọwara sị, "Onye nwere nnukwu ego maọbụ onye mara mma maọbụ onye ma ihe mana ọ na-akpa agwa ọjọọ, ndị Igbo na-akpọ ya, 'ugo mara mma mana ọ na-eri awọ '

" Nke a bụ n'ihi na ama ugo dịka anụ siri ike, na-akpa ike, na-efe n'elu karịcha mana ihe o ji eme nri bụ awọ bụ anụ ọtụtụ mmadụ na-asọ oyi."

Enwe na nkịta bụ nwanne

Monkey

Ebe foto si, Getty Images

Igbo nwere nkwenye na enwe bụ mmadụ"n'ihi na enwe nwere ihe ngoso dị iche iche dịka gosiri na o nwere ihe jikọrọ ya na mmadụ.

Igbo kwenyekwa e na enwe na nkịta bụ nwanne.

"Ha bụ nwanne were ruo oge enwe na nkịta nwere okwu."

"Nkịta nwere gbalata n'ụlọ na-akụziri mmadụ ebe enwe ya na ya na-ese okwu na anụmanụ ndị ọzọ bi n'ọhịa.

Enwe bụ mmadụ mana ha enweghị ike ikwu okwu

Ebule bụ anụ ike.

Ebule na-ekji mpi asogbu anụ n'ile.

Ebule na-epute mpi e

Anụ nwe mpi

"Ebule laa azụ, ọ bịa ọgụ."

Ụsụ abụghị anụ elu, ọ bụghị anụ ala

Ụsụ

Ebe foto si, Getty Images

Igbo na-ahụta ụsụ dịka ajọ anụ.

Igbo na-ekwu sị, 'Ụsụ sị na ya ma ka ya si jọọ njọ were abalị akpa.'

Dịka Nwangene siri kwụọ, Igbo ejighị anya ọma ele ụsụ.

Ọ sịrị: "Ụsụ na-akpa n'abalị maka maka n'ụsụ nwere omume ọjọọ."

"Ụsụ bụ ajọ anụ; o soghị na anu elu, o soghị n'anụ ala."

O kwuru na e nwere ọtụtụ obodo n'Igbo anaghị eri ụsụ, ebe e nwekwa ndị na-eri ya.