'Vesicovaginal Fistula mere ka di na ndị enyị m gbaara m ọsọ' - Lucia Ofegbu

Aha onyonyo, Lucia Ofegbu: 'Visco Virgina Festula mere ka di na ndị enyị m gbara m ọsọ'

Lucia Ofegbu bụ nwaanyị gbara afọ iri na asatọ mgbe ọ nụrụ di.

Mgbe ọ gara ịmụ nwa, ọ tụtara ime ejima mana ọ nweghịike ịmụ ụmụaka ahụ n'udo.

Ụmụaka abụọ ahụ mechere nwụlahụ ya. Ọ bụghị ebe o biri.

Ka ọ nọdigere, Lucia chọpụtara na mmamiri na abalahụ ya mgbe ọ maghị.

Nke a mere ka akwa na ahụ ya na-esi isi mgbe niile.

Ọ mechere dị ya sị ya laa be nna ya gaa gwọtu onwe ya ka o mechere ihe niile o nwereike ime iji hụ na ya bụ ọrịa lara.

Lucia lara be nna ya ga nọọ afọ atọ mana mamiri ahụ akwụsịghị.

Mgbe ọ laghachitere azụ na be dị ya, ihe bịara siwere ya ike nke bụ na ndị be dị ya malitere ịsọ ya oyi.

Ndị enyị ya malitere ịkpachapụ ya nke bụ na Lucia anaghịzị aganwu mmeme ọbụla.

Ọ gaa ụka, ọ na-anọ n'azụ azụ ebe mmadụ agaghị anọ ya nso maka isi ọjọọ.

Otu ụbọchị Lucia gara nkwuputa ka fada ha jụwara ya ihe mere o ji anọ n'azụazụ n'ụka.

Lucia malitere ịbe akwa, meche ụmụnwaanyị ibe ya bịara ọkọwaara fada ihe mere Lucia ji anọpụ iche.

Mgbe ahụ ka Fada jizi duru ya gaa ebe a ga-eleta ya anya.

Gee akụkọ Lucia n'ọnụ ya. Ka e mechere, agwọtara Lucia mana ọ nweghịzị ike ịmụ nwa ọzọ.

Ọ nọghịzị be dị nke o ji amụ nwa ọzọ. Mana ahụ dị ya ebe ọ na-arụ ọrụ nke taa.

Lucia Ofegbu