Peter Okpaleke: Etu e si chie ya Kadịnal na Rome

Mgbe Poopu Francis duru Bishop Okpaleke iyi ọrụ

Ebe foto si, Vatican News

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Poopu Francis eduola Bishọp Peter Okpaleke nke ụka katọlịk n'Ekwulobia na mmadụ 19 ndị ọzọ n'iyi ọrụ dịka Kadịnal taa bụ Satọdee, ụbọchị 27 nke ọnwa Ọgọọst, 2022.

Okpaleke so n'ime mmadụ iri abụọ ahọpụtara n'ọkwa Kadịnal a dịka e mere emume iti mmanụ na idu iyi ọrụ ha n'ụka St. Peter Basilica, Rome.

Okpaleke ga-abụ onye nke ise bụ nwaafọ Naijirịa echirila echichi Kadịnal dịka nke a ga-eme ya ugboro asatọ Poopu Francis na-ete ndị Kadịnal ahọpụtara mmanụ.

Akwụkwọ ozi si ụlọọrụ mgbasaozi Vatican kwuru na mamdụ 16 n'ime mmadụ 20 ndị e tere mmanụ taa bụ Satọdee erubeghị afọ 80.

Dịka e techapụrụ ndị mmanụ ma nye ha ikike ịbụ Kadịnal, ha gara n'ụlọ ili ebe e dobere onye bụbu Poopu bụ Poopu Benedict XVI.

Ebe Bishọp Okpaleke na ndị Kadịnal ndị ọzọ nọ n'eme ịtị mmanụ a.

Ebe foto si, EWTN

Nkọwa foto, Ebe Bishọp Okpaleke na ndị Kadịnal ndị ọzọ nọ n'eme ịtị mmanụ a.

Ha nọ ebe ahụ bụ Mater Ecclesiae Monastery kpee ekpere dịka Poopu Francis dụrụ ha ndọmọdụ ka soro ụkpụrụ Karaịst n'igbaso ịhụnanya, udo nakwa ịlekọta ụwa ma duo ndị mmadụ n'ụzọ nke Kraịsti.

Bịshọpụ Peter Okpaleke so na ndị isi ụka mmadụ 20 Poopu Francis ụka Katọlik kpọpụtara aha ha n'ọnwa Mee nke afọ na a ga-ete mmanụ ịbụ 'Cardinal' nke kpalitere ọtụtụ ọṅụ nye ndị mmadụ na Naịjirịa.

Aka chịbụrụ Anambra steeti bụ Peter Obi, aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo nakwa ụfọdụ ndị Sịnetọ steeti ahụ so gaa emume a pụrụiche e mere taa.

Mmadụ 20 ndị e duru iyi ọrụ taa bụ ụbọchị 27 nke Ọnwa Ọọgọst, 2022

Ebe foto si, Vatican News

Nkọwa foto, Mmadụ 20 ndị e duru iyi ọrụ taa bụ ụbọchị 27 nke Ọnwa Ọọgọst, 2022
Mgbe Peter Obi sonyere n'emume idu iyi ọrụ ndị Kadịnal na Rome.

Ebe foto si, Catholic Broadcast Commission,Nigeria.

Nkọwa foto, Mgbe Peter Obi sonyere n'emume idu iyi ọrụ ndị Kadịnal na Rome.
Gọvanọ Soludo na nwunye ya sonyere n'emume idu iyi orụ a.

Ebe foto si, Soludo TV

Nkọwa foto, Gọvanọ Soludo na nwunye ya sonyere n'emume idu iyi orụ a.
Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Cheta na aha Okpaleke malitere wuwe na Naijiria niile dịka ndị ụkọchụkwu na ndị ụka Katọlik na Ahiara Dayọsis jụrụ ịnabata nhọpụta a họpụtara ya dịka Bịshọpụ n'afọ 2012 mana e mechara mee ya Bishopụ Ekwulobia.

Ije Okpaleke dịka ụkọchukwu malitere na mberede dịka a kpọrọ ya gbaa odibo n'ofufe nro mbụ ya n'amụghị ya amụ otu ụbọchịụka dịka ndị na-agba odibo n'ọlta nke a na-akpọ "mass servers" abaghị ụka n'ihi mmiri ozizo.

Ihe i kwesịrị ị maka Bishop Peter Okpaleke emere 'Cardinal'

Ebe foto si, Ekwulobia Catholic Dioceses/Facebook

Nkọwa foto, Ihe i kwesịrị ị maka Bishop Peter Okpaleke emere 'Cardinal'

Ihe i kwesịrị ịma maka Bishop Okpaleke

  • A mụrụ Peter Okpaleke na ejima ya bụ Paul n'abalị Mbụ nke ọnwa Maachị, afọ 1963.
  • Onye Amesi dị n'Okpuru Ọchịchị Aguata, nne na nna ya bụ Reuben Ezeuko Okpaleke na Bridget Ekejimma Okpaleke.
  • Mana Bishọpu Okpaleke toro n'Ụga n'aka nnenne ya bụ Evelyn Abiahuaku Ibekwe bụ ebe ọ gara Oganiru Primary School na Uga Boys' Secondary School.
  • Ọ gara seminary na St. John Bosco Seminary Isuaniocha, Bigard Memorial Seminary bụ nke a ma ugbua dịka St. Joseph's Major Seminary Ikot-Ekpene, Catholic Institute of West Africa (CIWA), Port Harcourt na mahadum 'Pontificia Universita Della Santa Croce, Rome, Italy' bụ ebe o nwetara "first class" bụ ebe o nwere na "Canon Law"
  • E chiri ya ụkọchukwu n'abalị 22 nke ọnwa Ọgọst afọ 1992.
  • Ọ rụọla dịka ụkọchukwu na-achịkọta St. Anthony's parish Nanka, Ss. John and Paul Umubele Awka na St. Joseph the Worker Chaplaincy, Nnamdi Azikiwe University Awka.