Ịkpụ ụzụ, ịkpa akwa, ịpị osisi, ịkụ mmanya na ọrụaka ndị ọzọ ndị Igbo na-arụ mgbe gboo

Aka na-akpụ ụzụ, nwaanyị na-akpa akwa, na nwoke na-apị osisi.

Ebe foto si, BBC/Getty Images

    • Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Na mgbe gboo, mgbe elu bụ ala ọsa, ndị Igbo bụ ndị e ji ịgba mbọ mara, bụ nke ha na-egosipụta site n'ọrụ aka dị iche iche.

O nweghi onye nwereike ịkọwa kpọmkwem mgbe ha malitere ụfọdụ ọrụ aka ndị a.

Ndị Igbo amalite ụfọdụ n'ime ha tupu ọbịbịa ndị ọcha n'Afrịka, Naịjirịa nakwa na mpaghara ala Igbo.

Ọrụaka ndị a bụ ihe ndị Igbo ji ebi ndụ ha, ha jikwa ya ewulite akụnaụba, azụ ụmụ ha nakwa imepụta nri ha na-eri.

Obodo dị iche iche n'ala Igbo nwere ọrụaka ndị e ji maara ha bụ nke na-esi n'agbụrụ fee n'agbụrụ site n'ịkuziri ya ndị mmadụ.

Ụfọdụ ọrụaka e ji maara ndị Igbo gụnyere; ịkpụ ụzụ, ịpị osisi na igwe, ịkụ mmanya, ịgba nta, ịtụ ụlọ (nkarịnka maọbụ aja), igụ nnọọ, ịzọ aja, ịwa osisi, igbu nkwụ, ọrụ ugbo dgz.

Pịa aka ebe a ka i soro BBC News Igbo na Whatsapp
Nkọwa foto, Pịa aka ebe a ka i soro BBC News Igbo na Whatsapp

Ịkpụ ụzụ

Aka onye na-akpụ ụzụ na igwe ọ kpụtara

Ebe foto si, Onukwube/Facebook

Ịkpụ ụzụ bụ ọrụaka nka na ụzụ pụrụiche. Ọ bụ otu n'ime ọrụ aka kachasị gbapụta ihe n'ala Igbo mgbe gboo.

A na-akpụ ụzụ site n'iwete mkpirisi igwe, ṅaa ya n'ọkụ ka ha gbazee, tupu e were ya kpụọ ihe ọbụla masịrị onye nka ahụ.

Ụfọdụ ihe ndị a na-akpụpụta n'ụzụ bụ ọgụ, egbe, mma, osite (ekwu igwe), ọnya na akụrụngwa ndị ọzọ dị mkpa.

Ụfọdụ obodo ndị e ji ịkpụ ụzụ maara n'ala Igbo gụnyere Awka na Akulu Isuofia dị n'Anambra Steeti, Nkwerre dị n'Imo Steeti, Abiriba dị n'Abia Steeti dgz.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Ịkụ mmanya (ngwọ maọbụ nkwụ)

Maazị Ikechukwu bụ diochi na-akụ mmanya ngwọ.
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ịkụ mmanya bụ otu n'ime ọrụ aka ndị Igbo ji e bi ndụ mgbe gboo ma rute ugbua.

A na-eji ya amịpụta mmanya ọṅụṅụ site n'osisi ngwọ a na-akpọ mmanya ngwọ maọbụ osisi nkwụ a na-akpọ nkwụ elu.

Otu onye na-akụ ngwọ BBC Igbo gbara ajụjụọnụ n'afọ 2018 bụ Ikechi Osondu kwuru na ọ malitere ịkụ mmanya nwgọ n'afọ 1982 mgbe, na ọ mụtara ya site n'aka nna ya bụ onye mụtara ya n'aka nna nna ya.

Osondu kwuru na ọ bụ mgbe nna ya nwụrụ ka ọ malitere ọrụ aka ịkụ ngwọ n'uju maka na o nweghi onye ọzọ ọ mara n'aka ịkụ ngwọ ma ọ bụghị ya.

O kwuru na ọ na-eme nke a site n'ịrị n'elu osisi ngwọ dị n'akụkọ ụlọ were obere igwe nwere ọnụ kụpuo akụkụ osisi ahụ ma chenye ewere maọbụ obere ite, werezie akwụkwọ ndụ kpuchie ma were ụdọ kedo ya n'ahụ osisi ahụ.

Mmanya ngwọ ahụ ga-eji nwaayọọ na-atapụta tupu ọ tajuo efere maọbụ ite ahụ.

O kwuru na ihe a na-akpọ ndị na-akụ mmanya bụ diochi n'asụsụ obodo Ngwa nke Abia Steeti, obodo ndị ọzọ a maara n'akụ mmanya bụ Udi nke Engugwu Steeti nakwa ọtụtụ obodo ọzọ.

Ịpị osisi/Igwe

Nwoke ji apị igwe na-apị osisi

Ebe foto si, Getty Images

Nke a bụ mgbe e ji osisi arụpụta ihe dị iche iche site n'iji akụrụngwa na-aghọ nkọ kwọchasịa ahụ osisi ahụ ma were ya kpụọ ihe dị iche iche dịka oche, mkpara, chi a na-apịrị apị, arụnsị, ọnụụzọ, mpio dgz.

E nwekwara ndị nke a na-eji akụrụnngwa igwe apịpụta ihe ndị dị iche iche dịka ndị obodo Igbo Ukwu n'Anambra Steeti na-eji akụrụngwa ọlanchara (bronze) kpụpụta ọtụtụ ihe dị iche iche mgbe gboo.

Ịtụ ụlọ na Ịzọ aja

Ụmụnwoke abụọ na-atinye akịrịka n'elu ụlọ aja.

Ebe foto si, Getty Images

Nke a bụ ọrụ aka ndị Igbo ji arụ ụlọ obibi ha tupu a malite ịrụ ụlọ ọgbara ọhụrụ e ji sementị na okwute na aja ọcha arụ ugbua.

Ịzọ aja bụ ọrụ aka a na-eme site n'igwupụta aja ụrọ n'ala, wụọ ya mmiri ma were ụkwụ na-azọ ya iji gwakọọ aja na mmiri ahụ ebe ọ ga-abụ ndị na-atụ ụlọ tụọ aja ahụ n'ahụ osisi achara e ji arụ ụlọ ka o nweeike rapara ọfụma. Aja ụrọ na mmiri ahụ agwakọrọ dịka ebe a gwakọrọ sementị, aja ọcha na mmiri ọnụ.

Ndị na-atụ ụlọ bụ ndị na-arụ ụlọ obibi, ha egwu ala sụnye ya osiri achara, were ụfọdụ kpaa ahụ ụlọ ahụ ma kesaa ya n'ọnụ mkpuka ole a chọrọ ka ụlọ ahụ bụrụ, tupu ha ewerezie aja ụrọ ahụ a zọrọ tụọ n'ahụ ụlọ ahụ ka ọ bụrụ ụlọ aja.

Ihe ọzọ ndị na-atụ ụlọ na-eme bụ iji alakara osisi nkwụ kpaa ihe a na-akpọ akịrịka ma tinye ya n'elu ụlọ iji gbochie mmiri na anwụ ịbata n'ụlọ aja ahụ.

Obodo niile nọ n'ala Igbo nwere ndị na-azọ aja, ndị na-atụ ụlọ na ndị na-akpa akịrịka ụlọ.

Ịkpa akwa

Nwaanyị obodo Akwete na-akpa akwa.
Nkọwa foto, Akụkọ kwuru na nwaanyị na-abụghị onye obodo Akwete anaghị amụta ka e si akpa akwa a.

Ịkpa akwa bụ otu n'ime ọrụ aka ndị Igbo ji arụpụta uwe ha na-eyi n'ahụ na mgboo tupu ndị ọcha abịa na mpaghara ala Igbo.

Ụmụnwaanyị bụ ndị nọ n'isi imepụta akụrụngwa na ihe ndị e ji akpa akwa ndị a. Ọrụ ha gụnyere ịkọ mkpụrụ owu, zụọ ya ruo mgbe ọ ga-etopụta.

Ha ga-aghọ ya ma were ya mepụta eriri owu ha ji akpa akwa.

Otu nwaanyị na-akpa akwa n'obodo Akwete dị n'Abia Steeti bụ Gladys Akuatta gwara BBC Igbo na ha malitere ịkpa akwa n'obodo mgbe gboo.

O kwuru na ọ bụ nwaanyị a kpọrọ Dada Nwakata malitere ịkpa akwa site n'ihe e gosiri ya n'ime nrọ.

Na ọ pụtara n'ihe malite ịkpa akwa a, ma kuziere ya ụmụnwaanyị ndị ọzọ n'obodo ha.

Gladys gara n'ihu kwuo na ha anaghị akụziri onye na-abụghị onye Akwete etu esi akpa akwa a n'ihi na ọ gaghị amụta ya.

Na nke a bụ iwu e tinyere n'obodo Akwete gbaa gburugburu.

Obodo ndị ọzọ na-akpakwa akwa n'ala Igbo bụ Abakaliki nke Ebonyi Steeti, Nsukka dị n'Anambra Steeti, Anaocha dị na Delta Steeti.