Asuu Strike: Ndị nkụzị mahadum ka kwụkwa ebe ha kwụ

Ebe foto si, Getty Images
Uche ọtụtụ ndị mmadụ bụ na gọọmentị etiti na ngalaba na-ahụ maka ndị nkụzị mahadum na Naịjirịa enwela nkwekọrịta ga-eme ka ụmụakwụkwọ laghachịe ụlọakwụkwọ ha, mana ihe na-ebe ka na-ebe kwa.
Nke a pụtara ka ndị Asuu anabataghị nkwa gọọmentị etiti kwere ha mgbe ha nwere nzukọ n'izu a.
Nzukọ ahụ bụ nke asaa gọọmentị Asuu na gọọmenti etiti na-enwe maka okwu abụbụ ọru ndị Asuu na-eme.
N'ụbọchi Tusde nke ọnwa Janụwarị 2019, Minista na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige kwuru na gọọmentị etiti na Asuu na-abịa nso inwe nkwekọrịta.
Mana, dịka ọkwụ ugbua, Asuu na-akọwa na ha ekweghị n'atụmatụ gọọmentị.
Nke pụtara na mgbape mahadum dị iche iche ka nwereike bụrụ ihe a na-anụ n'akụkọ mana agaghi ahụ n'anya na nso nso.
Na mkaprịtaụka Asuu na ụlọ ntaakụkọ Premium Times nwere, onyeisi ha bụ Biodun Ogunyemi sị na ọ bụ ndị otu ya kwuru na ha anabataghị nkwa gọọmenti kwere.
Ọ gakwara n'ihu gwa ndị Premium Times na ọbụghi eziokwu na gọọmentị enweghị ego ha ga-eji mezuo ihe Asuu chọrọ.
BBC Igbo kpọrọ Ogunyemi ịnụta n'ọnu ya mana ọzaghị ekwenti ya. BBC zigakwara ya ozi na SMS, mana ọ sabeghi tupu akụkọ a pụo.








