Donald Trump, Fada Ejike Mbaka, uwe ọhụrụ ndị Super Eagles na ihe ndị ọzọ wuru n'izu a

Izuụka a malitere n'ụbọchị abụọ ma kwụsị n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Febụwarị afọ 2020, nwere ihe e ji kpọọ ya 'ọpụrụiche'.
Ihe ndị mere na ya bụ izu gụnyere akụkọ ndọrọndọrọ, egwuregwu, ịkpaọchị dgz, na Naịjirịa nakwa ụwa niile gbaa gburugburu.
Ụfọdụ akụkọ ndị a gụnyere;
Emeka Ihedioha na Fada Ejike Mbaka

N'izuụka a, BBC Igbo gbara Emeka Ihedioha ajụjụ banyere ihe mere o ji alaghachị n'ụlọikpe kachasị kamgbe ha chụturu ya dịka gọvanọ Imo Steeti.
Na nzaghachi, Ihedioha sị na ọ bụ n'ihi na ya na ndị ọkaiwu ya chọpụtara na ikpe ahụ ụlọikpe a kpere edochaghị anya.
Tinyekwara na ha nwere ohere ịlaghachị azụ ka ụlọikpe tulegharịa ikpe ahụ.
Mkparịtaụka a butere ọtụtụ okwu na soshal midia.
Na nke yiri ibe ya, ụkọchụkwụ 'Adoration Ministry Enugwu' bụ Fada Ejike Mbaka kwuru ihe wuru ewu n'izu a.
O kwuru na ọ bụrụ na Ihedioha akapcharaghị anya, na ọ ga-aga mkpọrọ n'ihi etu o si achụso ikpe nchụtu ya.
Amalitela ịna 7.5% VAT maka oku na ozi ekwentị

Ebe foto si, Getty Images
N'izuụka a ka ụlọorụ ekwentị kwuputara na ha ga-amalite ịna pasentị asaa na ụma ise dịka ụtụisi ịkpọ oku nakwa izipu ozi n'ekwentị.
Ọ malitere iwu na soshal midia Twitter, ebe ọtụtụ ndị mmadụ gbarụrụ ihu na-ekwu na nke a gosiri n'ihe na-esiwanye ike na Naịjirịa.
Iji maa atụ, ozi 'sms' a na-anabu naịra anọ bụzị naịra anọ na kobo iri ugbua n'ihi VAT.
Cheta na onyeisiala Buhari binyere aka n'iwu a kpọrọ 'Finance Act' n'ọnwa Jenụwarị.
Iwu ahụ kwuru na a ga-ebuli ụtụisi 'Value Added Tax' (VAT) site na pasentị ise ruo pasentị asaa na ụma ise.
Aka Donald Trump dị ọcha

Ebe foto si, Reuters
N'ụbọchị Wenezde nke izu a, ndịomeiwu mba Amerịka mere ntuliaka ma kwuo na aka onyeisiala ha bụ Donald Trump dị ọcha n'ebubo abụọ e boro ya.
Ndị ụlọomeiwu nta mba Amerịka boro Trump ebubo na ọ na-emebi ikike ọchichị ya nakwa ụlọomeiwu n'ọnwa Disemba 2019.
Mana ndị Sịnetị kụchapụrụ ebubo ndị a ma kwuo na o nweghi iwu ọbụla Trump dara.
Nke a mere ya onyeisiala mba Amerịka nke atọ e boro ebubo nchutu n'ọchịchị.
Pati nọ na Naịjiria ga-abụzị naanị 18

Ebe foto si, Getty Images
N'ụbọchị Tọzde n'izu a ka onyeisi ụlọọrụ Inec bụ Mahmood Yakubu weturu ọnụọgụgụ pati nọ Naịjirịa site n'iri itoolu ruo iri na asatọ.
Nke a mere oke mkpọtụ na Naịjirịa dịka ọtụtụ ndị mmadụ kpụ ụlọọrụ Inec n'ọnụ.
Mmachi keke na ọgbatumtum na Legọs

N'ụbọchị Monde izu a, ndịọrụ Bekee na ndịọrụ dị icheiche bi na Legọs takutere ya kọnkịrị dịka ha na-aga ọrụ ka e zuchara ike ngwụcha izu.
Nke a bụ maka mmachi gọọmentị steeti ahụ machiri keke na okada nke malitere n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Febụwarị afọ 2020.
Ngwa ka anyị nabata gị n'ọgbọ egwuregwu na obi aṅụrị ebe a;
Abụ m nwaafọ Naịjirịa - Lil Wayne

Ebe foto si, Getty Images
N'otu izu a ka nwaafọ Amerịka na-eti egwu bụ Lil Wayne kwupụtara na ọ bụ nwaafọ Naịjirịa nke butekwara ọtụtụ okwu n'etiti ndị Naịjirịa.
Mgbe ọ na-aza ajụjụ ọnụ, Lil Wayne sị na o mere nyocha ahụ ma chọpụta na o ji pasentị 53 bụrụ nwaafọ Naịjirịa.
O kwuru na ya na nne ya nwere ezigbo mkparịtaụka gbasara nke ahụ.
Uwe bọọlụ ohụrụ nke Naịjirịa

Ebe foto si, NFF
N'ụbọchị ise nke ọnwa Febụwarị a ka otu egwuregwu bọọlụ Naịjirịa bụ Nigeria Football Federation(NFF) wepụtara uwe ọhụrụ a ga na-eji agba bọọlụ.
Ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa katọrọ uwe a ma kwuo na nke a bụ mkparị nye Naịjirịa ebe ndị ọzọ katọrọ ndị e ji gosi uwe a.
Ị lezie anya ị ga-ahụ na akụkọ ndị a na ndị ọzọ na-anọghị ebe a mere ka izuụka a bụrụ 'ọpụrụiche' na nke onwe ya.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:












