Love Relationships: Lee ihe anọ ga-eme ka nwoke ghara ịchụ nwaanyị

Nwoke nọ n'hu ụgbọala ọhụrụ

Ebe foto si, Segun Oyeyemi

Nkọwa foto, Ụmụagbọghọ agba ọhụrụ chọrọ nwoke nwere ego

Ụfọdụ oge ka ị ga-anụ ebe nwoke na-agba n'ezi na-ekodo aka n'ihe dị icheiche ikwu na ọ bụ ihe mere o ji eme ihe ọ na-eme.

Ọtụtụ n'ime ndị na-akpa agwa a anaghị eche maka ọnọdụ nwunye ha lụbatara n'ime ụlọ nọ n'ime ya ka ha na-eme etu a n'ihi na ọ bụ nke masịrị ha ka ha chọrọ.

Mana ụfọdụ ndị na-akpa agwa a amaghị na e nwere uru dị n'ịchịba ụkwụ n'ụlọ, biri n'udo dịka di na nwunye, na-agbaghị n'ezi.

Nwoke na na nwaanyị

Ebe foto si, Getty Images

Ị na-ajụ 'kedụ uru nwanụ'? Ngwa lee ha ebe a:

1) Ọ ga-akpịtara gị ego:

Ị tinye anya gị naanị na nwaanyị ị lụrụ alụ nke gị na ya bi n'ụlọ, ị gaghị na-atufu oke ego.

Onye ọbụla ma na ịchụ nwaanyị na-ebute ntufu ego; nke bụ na ị ga na-enye nwaanyị ahụ ị na-achụ ihe niile ọ chọrọ n'ihi na ị chọrọ ime ya obi ụtọ.

Ego

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọtụtụ nwaanyị a lụrụ alụ na-abụkarị odoziakụ karịa ndị nke a na-akpọ 'side chick' na-abụkarị akụ ka ha bịara iri

Marakwa na ụfọdụ 'na-azụ' enyi ha nwaanyị ma na-elekọtakwa nwunye ha na ezinaụlọ ha.

Mana nwanne ọ bụrụ naanị n'ahụ nwunye gị ka anya gị dị, ị mara na ị gaghị eke ego na akụnaụba gị ụzọ abụọ.

Makana odoziakụ gị ga-eji ego ahụ mepụta ihe ị hụrụ anya, n'ụzọ ga-amasịkwa gị.

2) Ọ ga-akwudo gị n'akụkụ ma n'ụbịam ma n'akụnaụba

Gị na-agụ akụkọ a kwuo eziokwu, ugboro ole ka ị hụrụla maọbụ nụ akụkọ nwoke na-agba n'ezi enyi ya nwaanyị wụsara ya n'ala n'ihi na ọ naghị enyezi ya ihe ọ chọrọ?

N'ihi na ọtụtụ oge ego ka ụmụnwoke na-eji achụta nwaanyị na-abụghị nwunye ha, ọ na-abụ ihe ntakịrị dịka ọdachi dapụtara ha, enyi ha nwaanyị ahụ ewee mwemwe ọsọ mgbe ọ hụrụ na ego adịghịzịkwa gị n'aka ọzọ.

Mana ọtụtụ oge ka nwunye ha lụrụ na-enwere ha ndidi ma ihe isiike dapụtara ha.

Ha na-echeta nkwa ha kwere mgbe a na-ejikọ ha n'ụlọụka ebe ha kwuru na ha ga-ahụ di ha n'anya "ma n'ụbịam ma n'akụnaụba".

Ọ bụkwa nwaanyị ị lụbatara n'ụlọ ga na-ekpuchi gị ka ihere ghara ime gị ma ụwa gị tụgharịa.

3) Ụjọ ọrịa agaghị na-atụcha gị:

Ị na-anụ mgbe ọ na-abụ a na-ejikọ di na nwunye n'ụlọụka ha ekwe nkwa "ilekọta gị ma n'ọrịa ma n'ahụike"?

Agbamakwụkwọ

Ebe foto si, Getty Images

Ị bụrụ onye na-achụ nwaanyị, mgbe ọrịa dị aṅaa bịara gị ka ị ga-ama ma nke a ọ bụ eziokwu ma ọ bụ asị.

Ọtụtụ oge, ụdịrị ọsọ nwaanyị ahụ ị na-achụ ga-eji wụsa ihe niile gbasara gị wee gbafuo, ị ga na-ajụ "kedụ onye m mejọrọ n'ụwa?"

Ọ bụkwa nwaanyị ahụ ị lụbatara n'ụlọ na-anọkarị, lekọta gị n'ọrịa ahụ ma na-ekpekwa ekpere ka ụdịrị ihe a ghara ịdakwasị gị ọzọ.

4) Ihe ị na-achọ n'uko elu dị n'uko ala:

Kwuo eziokwu, kedụ ihe na-eme ka ị chụrụ nwaanyị pụọ n'ezi?

Ọ bụ mma? Ezigbo ahụ? Amamihe? Ịhụnanya?

Ọ bụrụ na ị na-agwa onwe gị eziokwu ị ga-ama na ọtụtụ oge ihe ahụ ị na-achọ n'ezi nọ n'ime ụlọ gị.

Ụfọdụ oge ị naghị ahụ ya n'ihi na ị chọghị ịhụ ịhụnanya nwunye gị bụ nwaanyị mụrụ nwa/ụmụ gị, na-egosi gị.

Mana ị ma na ị na-egosikwa nwunye gị ịhụnanya ọ na-egosi gị, na enweghị ihe ị chọrọ ka o mee ọ na-agahị emere gị?

Ụfọdụ oge ka ị ga-ahụ ka ụmụnwaanyị ndị buru ibu na-agba mbọ ịta ahụ ka ha nwee ike ịdị ka ụdịrị nwaanyị di ha na-achụ n'ezi.

Nke a bụ ọmụmaatụ ihe ịhụnanya nwereike ime.

Ihe ndị ọzọ dị iche iche kwesịrị ime ka nwoke ghara ịchụ nwaanyị maọbụ gbaa n'ezi.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Anyị alụọla afọ 57 mana anyị anaghị atọ ka shuga mgbe niile