Bournemouth vs Chelsea: Mmanya ngwọ ndị Chelsea agbọghị ụfụfụ na be Bournemouth

Ndị otu Chelsea na AFC Bournemouth

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị otu Chelsea na AFC Bournemouth

Dịka ndị otu Chlesea na-agba mbọ ihụ na ha sọ n'agba nke mbụ n'asọmpị Premiership ka ndị AFC Bournemouth chọrọ itinyere ha aja n'garri.

Ọ bụ na nkeji nke iri atọ na asaa ka Marcos Alonso nke Chelsea nyere goolu nke mbụ dịka ọ jiri shọtụ Giroud nke kụrụ n'baa were takaa netị ndị Bournemouth.

Cheta na ọ bụ Alonso achụpụrụ mgbe ha na Bayern Munich zutere nsonso a nyere goolu a.

N'agba nke abụọ ka Jefferson Lerma nke Bournemouth sahachịrị goolu ndị Chelsea.

Ọ bụ kọna Fraser gbara ka Lerma jiri were isi mee Caballero "ọ nọ nso eruaka".

Dịka ndị Bournemouth egbughị oge mgbe ha nyere goolu nke abụọ na nkeji iri anọ na isii.

Ndị Chelsea chere na ọ bụ 'offiside' mana VAR siri na ọ bụ goolu.

Chelsea gbalịrị ike ha nke mụtara mkpụrụ dịka Alonso gosi kwara na ọ bụ ọkaibe dịka o nyere goolu nke abụọ na nkeji iri asatọ na ise.

Chelsea ka bụ kwa ndị agba nke anọ na tebulu ebe ndị Bournemouth nọ n'agba nke iri na asaa.