Chelsea vs Bayern Munich: Bayern etiela Chelsea 'duka duka' ka onye e jidere n'ohi

Ebe foto si, Getty Images
Ndị Chelsea nabatara ndị Bayern Munich na Stamford Bridge maka asọmpi agba nke iri na isii nke Champions League, kama Bayern egosighị ha nsọpụrụ dịka ha ji ọkpụ goolu atọ asataghị otu wee metọọ ha na be ha.
Dịka a gbachara ọkara nke mbu, ọ dịka ndị otu Chelsea ama ihe ha na-eme, mere ka ndị na-akwado ha nwetu obere olileanya.
Ha chịkwa ọkụ wee bata, mana Serge Gnabry gbabuuru Arsenal bọọlụ gosiri na ya abụghị onye obi ọma, dịka o ji goolu were menyụọ ya bụ ọkụ na olileanya ha nwere, na nkeji 51.
Gnabry ezukwaranụ ike? Mba! N'ihi na o jikwara goolu ọzọ o nyere na nkeji 54 nke mezuru ya abụọ, na-erughi nkeji atọ o nyechara nke mbụ.
O nyegidere nsogbu, ma nwakwaa inye goolu ọzọ nke gaara emezu ya atọ, mana o riri ya.
Dịka agadị nwaanyị na-anaghị aka nka n'egwu ọ maara agba, Robert Lewandoski mezuru ya atọ na nkeji 76.
Ka ihe niile a na-eme, ndị Chelsea bịara dizie ka ndị na-achụ oke ebe ụlọ ha na-agba ọkụ.

Ebe foto si, Getty Images
Lịka lịka niile ha gbara bụ amịtaghị mkpụrụ, naanị akwụkwọ ọbara ọbara ka ha gbatara na nkeji 73, mgbe Marcos Alonso metara ihe e ji chụpụ ya.
Otu ihe ndị mmadụ kwesịrị ịma bụ na e meribeghị Bayern Munich n'agba nke iri na isii kamgbe ha bidoro zọwa iko Champions League.
Marakwa na ọ bụ Bayern ka Chelsea meriri n'afọ 2012, iji bulie Iko Champions League.
Ka ọ dị ugbua, naanị ihe ga-azọ Chelsea ndụ n'asọmpi a bụ ma ọrụ ebube mee n'isi ha, ma ọ bụrụ na Chelsea nye goolu anọ ma ndị Bayern asataghị otu mgbe ha ga-ezute ọzọ.
Otu abụọ a ga-ezute n'Allianz Arena bụ be ndị Bayern, n'ụbọchị 18 nke ọnwa Maachị, afọ 2020.
Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri a ga-amasị gị:











