WBC: Anthony Joshua a na-atụ Wilder egwu?

Deontay Wilder

Ebe foto si, Reuters

Ihe na-ewu na soshal midia kemgbe Deontay wilder na Tyson Fury kụchara ọkpọ bụ maka onye bụ ọkaibe n'ọkpọ.

Ebe ụfọdụ na-eche na Anthony Joshua ga-adọpụ Deontay Wilder akwa n'ukwu ọkachasị ka Tyson Fury kụpụchara ya kpakpando n'anya.

Ndị ọzọ na-eche na ọ bụ Deontay na-atụ Anthony egwu.

Ndị nkwado ha na-ekwu dịka o si gbasa ha.

Ebe ndị nke Wilder na-asị na ọ bụ ezie na Joshua na atụ ya egwu ndị nke Joshua na-ekwu na nke ahụ be ọkpụrụkpụ asị.

Ụfọdụ n'ime ha na-ekwukwa na onweghị onye na-atụ ibe ya egwu kama na ha ekwetabeghị otu aga esi kee ego ha ga-akụta na ya bụ ọkpọ.

Ha na-ekwu na ọ bụ ndị nchikọta Wilder bụ Shelly Finkel na onye ntuziaka ya bụ Al Haymon ka ọ ka njọ n'isi.

Shelly Finkel onyentuziaka Wilder

Ebe foto si, European Photopress Agency

Nkọwa foto, Shelly Finkel mgbe ọ na-ekwu okwu mgbe Tyson Fury na Deontay Wilder kụrụ ọkpọ

Ndị a na-ekwu na anyaukwu mmadụ abụọ a ka njọ ebe ha na-achọ ka ekee ihe nrite ha nhata nha ma kụọ ya bụ ọkpọ na mba Amerika.

Lee ihe nke a pụtara:

Ọkpọ mbụ Wilder kuru bụ Pay Per View (PPV) bụ nke ya na Tyson Fury kụrụ.

Nke a pụtara na ndị otu Joshua na-eche na o rubeghị ogo ka ya na ha kee ego ọkara.

Ha sị na ha agaghị eji ya tunyere Anthony Joshua PPV ya rugoro otu nde kemgbe ya na Klitshchko kụchara ọkpọ na Apreelu 2017.

Onwebeghị ndị katara ahụ n'ọkpọ ha na Wilder kụgoro ọkpọ na-abụghị nke ya na Tyson Fury nakwa nke Luis Ortiz.

Anthony Joshua

Ebe foto si, Reuters

Ndị niile ha na Wilder kụbụru ọkpọ bụ ndị "Cruiserweights", dịka ndị a sị ekwu.

Anthony Joshua akụọla ọkpọ 24 e merie ya n'otu, nweta "knockout" 21, ebe Deontay Wilder kụgoro ọkpọ 44 e merie ya n'otu ọ nweta "knockout" 41.

Anthony Joshua ji nturuugo IBF, IBO nakwa nke WBA "Super" dịka ọ nụgoro ọgụ ụgboro iri abụọ omerichara.

Wilder jibu nturuugo ọkaibe nke mbaụwa n'ọkpọ ruo ụbọchị 22 nke ọnwa Febrụwarị mgbe Tryson Fury napụrụ ya.

Ọ bụ ihe ndị a kpatara ha ji kwusie ike na ọ bụghị ụjọ ka Joshua na-atụ.

Mana kedu onye Anthony Joshua na-ahụ dịka ọgbatauhie?

Ihe onyonyo ebe ajụrụ Athony Joshua onye ọ na-ahụ dịka ọgbatauhie n'ọkpọ, Joshua sị na ọ bụ Tyson Fury na-echu ya ụra.

O kwuru na eneweghị onye nwere ike ị ma ihe Fury bu n'obi nke mere na ọ bụ ezigbo nsogbu nye ya.

Kama Joshua ekwuola na ọ dị njikere ka ya na Tyson Fury lụọ ọgụ.

Akụkọ ga-amasị gị