Ukraine Airlines: Iran ekwetela na ọ bụ ha gbaturu ụgbọelu PS752

Ụgbọelu a dara ka o si Tehran fepu

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Ụgbọelu a dara ka o si Tehran fepu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onyeisiala Iran ekwuola na ọ bụ ndị agha ha gbaturu ụgbọelu Yụkren.

Na ozi odere n'akara Twitter ya, Hassan Rouhani sị na nyocha ha mere chopụtara na ọ bụ na-amaghị ama ka ejiri gbatuo ụgbọelu a n'obodo Tehran ma gbuo mmadụ 176 nọ n'ime ya n'ụbọchị 8 nke ọnwa Janụwarị.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ụlọntaakukọ Fars deburu na onye mere ihe a nọzị n'aka ndị ọkaikpe ndị agha.

Ha sịkwa na ndị agha Iran nọ na nnukwu njikere maka nkwa mwakpo Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump na ndị ọchi agha ya kwere Iran.

Ukraine Airlines: Iran ekwetela na ọ bụ ha gbaturu ụgbọelu PS752

Ebe foto si, Getty Images

Ihe ọzọ ha kwuru bụ na ụgbọelu Yụkren a nwe akara PS752 na-efega ọdọ ndị agha Iran eji "Islamic Revolution Guards Corps" (IRGC) mara oge a gbaturu ya.

Ụgbọelu dapụrụ n'elu ka obele oge gachara ndị Iran tụru ogbunigwe elu n'ọdọ ndị agha Amerịka dị na Irak.

Ọkaiwu Malami si na okwu ụtụisi MTN dịzị n'aka ngalaba ụtụisi

Abubakar Malami, ọkaiwu ukwu nke gọọmentị etiti.

Ebe foto si, Twitter/@MalamiSan

Nkọwa foto, Abubakar Malami, ọkaiwu ukwu nke gọọmentị etiti.

Ọkaiwu ukwu Naịjirịa bụ Abubakar Malami awụsala mkpebi ya ịnata Ụlọọrụ mgbasaozi MTN ijeri naria abụọ maka ụtụisi.

Malami kpebiburu na MTN ji ụgwọ ụtu isi a mana ọ sịzị na ọ bụ ngalaba na-ahụ maka ụtụ isi ka ya bu okwu dịzị n'aka

Ohaneze na-akwado Amotekun

Nnia Nwodo

Ohaneze Ndịgbo akwadola atụmtau ndị Gọvanọ ọdịda anyanwụ Naịjirịa wepụtara maka nchekwa akpọrọ Amotekun.

Ọnụ na-ekwuru onyeisi Ohaneze bụ Nnia Nwodo bụ Emeka Attamah sị steeti niile nwere ikike ihazi nchekwa ha.

N'egwuregwu,

Serena Williams

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Williams kwụsịrị ịsọmpi n'ọnwa isii gara aga ịga mụọ nwa

Serena Williams gosiri Amanda Anismiova ihe ojiri buru Eze tenis ka ha zutere na asọmpị Auckland Classic n'ụtụtụ Satọde

Serena di afọ iri ato na asatọ enyeghidị Amanda di afọ iri na asatọ ohere irite ihe ọbụla na ya bu asọmpị