Port Harcourt Airport: Ndị njem chọrọ ime ngagharịiwe na Port Harcourt

Ozi na-eru anyị ntị na-akọwa na ndị mmadụ ka tọrọ n'ime ọdọụgbọelu Pọtakọt n'ihi na amalitebeghi njem kemgbe ụgbọelu Aipeace febara n'ime ọhịa.
Henrietta Yakubu kwuru na ọ bụ Ngalaba na-ahụ maka ụzọ njem ụgbọelu ka ọ dịrị ikwu mgbe a ga-amalite njem ọzọ.
Ndị njem ahụ kwuru na ha na-akwado ịme ngagharịwe gbasara ya bụ ọnọdụ.
Mmadụ abụọ emerụọla ahụ na Legọs
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ọzọ si Legọs apụta na-akọ na ụlọ elu dara na Oshodi ma merụọ mmadụ abụọ ahụ.
Ndị ọrụ gbata gbata depụtara n'akara Twitter ha na ndị agbatobi chọpụtara ma buga ndị ahụ ụlọọgwụ ebe ha na anata ọgwụgwọ ugbua.
Ha kwukwara na a na-alụgharị ya bụ ụloelu mgbe ọ dara.
Na mba ofesi,

Ebe foto si, Reuters
Mba Amerịka ezigarala mba Itiopia ozi itiakanobi maka ndị isi agha nwụrụ na mba ahụ mgbe otu onye ndu ndịagha nwara ịnara ọchịchị n'ike.
N'otu aka ahụ osote onye na-achịkọta okwu nchekwa n'ala ahụ bụ Gedebe Hailu gwara BBC na ha ka na-achọ onye ndu ahu malitere usoro ịnara ọchịchị n'ike.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Ọnụ na-ekwuchitere otu bọọlụ ụmụ nwaanyị Naịjirịa bụ Jane Nwaeze akọwala na o nweghi mgbe Super Falcons mere ngosi iwe n'ụlọoriri ebe ha nọ na Fransị
Nke a bịara dịka a nụrụ kepu kepu na Super Falcons jụrụ ịhapụ ụlọoriri ha ruo mgbe a ga-akwụ ha ụgwọ eji ha na bọọlụ ha gbara.

Ebe foto si, Ethiopian TV
Agbagbuola onyeisi ndị agha mba Etiopia bu Seare Mekonnen na Addis Ababa bu isi obodo mba ahụ.
Onyeisiala mba Etiopia bu Abiy Ahmed kwuru na a gbara Mekonnen egbe n'ọgbaaghara dapụtara na mpaghara Amhara.
Ọ bụ ebe Mekonnen gara ka o gbochie ndị chọrọ ịnapụ aka na-achị mpaghara Amhara ọchịchị n'ike ka agbagburu ya.
Agbagbukwara onye Gọvanọ mmpaghara ahụ bụ Ambachew Mekonnen nakwa otu onye ọrụ gọọmentị ọzọ n'ọgbaaghara ahụ.

Ebe foto si, Nigeria Immigration Service
Ngalaba na-ahụ maka ọpụpụ na mbata ndị mmadụ n'obodo bụ nke a kpọrọ Immigration Service na bekee ekwuola na akwụkwọ e ji eme njem (Passport) ọhụrụ ga-apụta n'izuka na-abịanụ.
Onyeisi ngalaba ahụ bụ Muhammad Babandede kwuru na onye na-enweghị akara njirimara onye bu ' National Identification Number' agaghị anatalị akwụkwọ njem ọhụrụ a.
Kpachị kpachị ụzọ Apapa

Ebe foto si, Novo Isoro/Twitter
Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo na gọvanọ Lagos steeti bụ Babajide Sanwo-Olu agaala n'Apapa, ogbe eji oke kpachi kpachi ụzọ wee mara ka ha weta ogbugbu tọrọ atọ nke ga-akwụsị kpachị kpachị a.
Ọ bụ ọnụ na-ekwuru gọvanọ Lagos steeti bụ Gboyega Akosile kwuru nke a.
Ka ọ dị ugbua Osinbajo awuchiela na mba Amerịka ebe ya na ogbo ya bụ Mike Pence ga-enwe nzukọ ụbọchị Wenezdee iji kpaa maka ọdịmma Naijiria na Amerịka.
Ụgbọelu Airpeace efebala ọhịa

Ebe foto si, @flyairpeace/Twitter
Ọ fọrọ obere ihe ka ọdachi dakwasị otu ụgbọelu Air Peace mgbe nke febatara Porthacourt n'ụbọchị Satodee abali iri abụọ na atọ nke ọnwa Juun.
Mana otu n'ime ndị isi ụlọọrụ ugboelu ahụ kwuru na ọ bụ oke mmiri ozuzo kpatara nke a.
Onweghi onye ọbula nwụrụ maọbụ merụọ ahụ na ihe ahụ merenụ.
Ndị na-ahụ maka njem ụgbọelu na Naijiria kwuru na ha ka na-enyocha otu ihe ọdachi ahụ si mee.
N'egwuregwu

Ebe foto si, CAF/Twitter
Ọgba bọọlụ Naijiria bụ Odion Ighalo bụzi okwu a kpụ n'ọnụ ugbua dika onyere otu goolu nke Naijiria ji merie mba Burundi na asọmpi AFCON ụnyahụ.
Ighalo bụ onye e webatara na nkeji iri asaa na ato gosiri ihe o ji bụrụ ọkaibe wee mee ka ndị otu egwu bọọlụ Super Eagles gbaa aka ahia.
N'ofesiAkụkọ ga amasị gị:








