Lagos-Badagry: Container adapiala ụgbọala na 'Trade Fair' n'ụzọ Badagry na Legọọsi

Gwongworo e ji ebu ngwa ahịa nke a na-akpọ 'container' na bekee adaala n'akụkụ ulọahịa 'tradefair International' dị n'ụzọ Badagry na Legọs steeti.
Ogbe ebe ihe ahụ mere bu ebe ọtụtụ ụmụ Igbo na-azọ ahịa.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Dịka BBC siri nụ, onweghị onye nwụrụ na ya bụ ihe mberede nke a na-enwe onye merụrụ ahụ.
Nke a abụghị mbụ ụdị ihe a na-eme na Steeti Legọs.
Abalị anọ gara aga, gwongworo bu ngwa ahia dapịara ụgbọala abụọ na Tinkan Ailand nke dị na Apapa na Legọs.
Otedola ereela Forte Oil, gaa ihu

Ebe foto si, Femi Otedola/Instagram
Otu onye ojiegochụego ama ama bụ Femi Otedola ereela ụlọrụ mmanụ ya ama dịka 'Forte Oil.'
Otedola gbara ama nke n'ozi o wepụtara n'igwe okwu Instagramm ya na ya agbaghapụla ya bụ ụgbọ banye n'ọzọ ya bụ inye ọkụ latrik site n'ụlọọrụ ọ kpọrọ 'Geregu Power Plc.'
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
Ụbọchị ncheta ọrịa ọbara nko 'Sickle Cell'

Ebe foto si, Getty Images
Dịka taa bụ ụbọchị ncheta ọrịa ọbara nko nke pụtara 'Sickle Cell' na Bekee ndị ọkachamara n'ihe gbasara nri na ihe ọ na-enye na-ahụ adụọla ndụmọdụ ọhụrụ.
Ha kwuru na nri dịka ji, akpụ na osikapa ga-enye ndị ahụ ike ma gbado ha ume.
Ha kwukwara na akwụkwọ nri na mkpụrụosisi dị icheiche bụ ụdị nri ndị na-arịa 'Sickle cell' kwesiri ị na-eri ga-edozi ahụ ha.
Ụlọikpe akagbuola iwu gbasara ịgbasa ozioma

Ebe foto si, @elrufai
Nke ọhụrụ na-eru anyị ntị ugbua bụ na otu ụlọikpe ukwu nke Kaduna steeti akagbuola iwu kwuru na onye ọbụla na-agbasa ozioma ga-anata ikike tupu o mee nke a nke ụlọomeiwu na gọọmenti steeti ahụ hiwere na nsonso.
Mana Gọọmentị Kaduna ekwuola na ha na-akwado ịgbagha mkpebi ahụ n'ụlọikpe.
Ụmụafọ Igbo ise emerụọla ahụ na Togo

Ebe foto si, Getty Images
Ụmụafọ Igbo ise merụrụ nnukwu ahụ na nghọtahie sogbu dapụtara n'etiti ụmụIgbo na ndị Togo na Lome, isiobodo Togo.
'Ṅụọ mmịrị tọgbọ iko n'ọgbọ egwuregwu bọọlụ'

Ebe foto si, Getty Images
Ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ n'Afrịka amanyela iwu ọhụrụ ga-enye ndị ọgba bọọlụ ohere abụọ iji ṅụ mmiri ma zuo ike n'ihi oke anwụ ọchịcha.
Iwu a ga-ebido n'asọmpi AFCON nke a ga-amalite n'ụbọchị Fraide izu a.











