Mmadu 3 na-eku mmanụ na gwongworo n'Ikorodu anwụola

Gwongworo bu mmanụ ụgbọala dara

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Gwongworo bu mmanụ ụgbọala na adakarị na Naịjirịa
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ụmụnwoke atọ so na ndị nọ na-eku mmanụ nrị na-agbapụta na gwongworo daala n'Odogunyan bụ obodo di n'Ikorodu na Legos steeti nwụrụ, otu nwanyị merụrụ nnukwu ahụ.

Ihe mberede a mere na ụtụtụ ụnyahu ka gwongworo a dara ka o n'eru ebe a kpọrọ 'Sabo Garage' n'Ikorodu.

Ka ihe a mere, ndị mmadụ che na ọ bụ mmanụ ụgbọala ka gwongworo a bu gbagara ebe ahụ iku mmanụ.

Ọ ka ha no na-eku mmanụ ka isi gwongworo a dala sụgbụọ mmadụ atọ n'ime ha.

gwongworo daara n'Ikorodu

Ebe foto si, @tonypox

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Otu nwoke na nwaanyị n'ime ndị a na-eku mmadụ merụrụ nnukwu ahu. Ha nọ zi na ụlọọgwụ 'general' na Ikorodu na-anata ọgwụggwọ.

Otu nwoke hụru ihe mberede a sị na mgbe gwongworo a dara, isi ha kopuru.

Onyeisi ndị gbata gbata na Legos bụ 'Lagos State Emergency Management Agency' (LASEMA), bụ Adesina Tiamiyu, sị na ha ma maka ihe mberede a, ma na-ariọ ndị na-anya ụgbọala ka ha na-akpachara anyị ma dobe iwu okporo ụzọ, ma yokwa ka ha n'enyocha ụgbọala ha tupu ha etinye isi n'ụzọ.