Air Peace: Ụgboelu ha kwụsịrị n'ime ọhịa na Port Harcourt

Ebe foto si, @flyairpeace/Twitter
Ọ fọrọ obere ihe ka ọdachi dakwasị otu ụgbọelu Air Peace mgbe ọ febara Port Harcourt ụbọchị iri abụọ na abuọ nke ọnwa June.
Onye nọ ebe ihe mere kọwara na ụgbọelu ahụ gafere okporoụzọ ebe o kwesiri ị ga ma danye n'ime ọhịa.
Dịka ọ dị ugbua o nweghi onye nwụrụ ma merụọ ahụ n'ihe ahụ ebe akụkọ ka na-abịa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Gọọmentị Naịjirịa na ọgbakọ mba ụwa bụ UN n'aha ịchafụ amapụtala nde dọlla iri n'ise iji wughari etu e si ahazi atịtị si na ngwa latrịk apụta
Ọ bụ Bashir Ahmad bụ ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Muhammadu Buhario kwuputara nke a site n'akara Twitter ya
N'akụkọ yiri ibe ya
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Onyeisi ụlọakụ etiti bụ Godwin emefiele ekwuola na ya bụ ụlọakụ adila njiikere inye ndị na-efe ala nna ha mbibi ego iji bido ahịa na ihe ndị ọzọ.
O kwuru na atụmatụ a ga-ebelate enweghi ọrụ nke na-enye ọtụtụ ndị ntorobia nsogbu na Naịjirịa.
Na mba ofesi,
Ndị ọrụ nchekwa egbuola ndị omekome echere bụ ndị Al-Shabbab na mba Kenya mgbe ha na-awakpo ụlọọrụ ndị uweojii na mba ahụ.
Ọ gụ a dara n'etiti ndị ọrụ nchekwa na ndị omekome ahụ takwara isi mmadụ asatọ bụ ndị uweojii.
N'egwuregwu,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Dịka ọ dị ugbua, otu Jamini ejirila ọkpụ goolu atọ gbanye ndị super falcons Naịjirịa ọgbaghara n'isi na agba nke mbụ nke asọmpi ha.
Nke a pụtara na agbapụla otu Naịjirịa n'asọmpi iko mbaụwa ụmụnmwaanyị nke 2019.









