Olisa Metu's claims over N400m: Jonathan atụpụghị ọnụ

Goodluck Ebere Jonathan

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Goodluck Ebere Jonathan

Aka chịburu Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan ajụla ịtụpụ ọnụ n' okwu Olisa Metu kwuru na ọ bụ ya nyere ya nde naira 400 a na ebo ya na o zuru.

Olisa Metu bụ onye rụbụrụ ọrụ dịka odeakwụkwọ mgbasa ozi nke ndị 'Peoples Democratic Party'.

Olisa Metu

Ebe foto si, Channels

Nkọwa foto, Olisa Metu

Olisa Metu kwuru na ọ bụ mgbe ya na Goodluck Jonathan nwere mkparịtaụka ka o nyere ya ego ahụ.

O kwukwara na ya bụ ego bụ maka iru ọrụ maka oganiru nke Naịjirịa.

Mgbe BBC kpọrọ Ikechukwu Eze onye bụ ọnụ na-ekwuchitere Jonathan, o kwuru na o nweghị ihe ha nwere ikwu n'ihi na okwu a ka nọ n'ụloikpe.

Chetakwa na Gọọmentị na-ekwu na ọ bụ Sambo Dasuki (rtd) nyere Olisa Metu ya bụ egọ, mana Olisa Metu kwuru na ebubo ahu abughị eziokwu.

Akụkọ ga-amasị gị: