E bula Metu nnukwu ụlọ ọgwụ dị na Nnewi

Metu
Nkọwa foto, Metu abiaghị n'ụlọ ikpe dị n' Abuja na ụbọchị Jenuwari 22

E bugala Olisa Metu, onye bụbu ode akwụkwọ gbasaozi ndị otu PDP na nnukwu ụlọ ọgwụ dị na Nnewi, Anambara Steeti.

E nwere egwu na ahụ ike nwa amadi ahu na-akawanye njọ mgbe aga ọsọ bute ya na nnukwu ụlọ ọgwụ,Nnamdi Azikiwe University Teaching Hospital (NAUTH),dị na Nnewi.

Cheta na Metu onye na-azara ọnụ ya ihe gbasara mpụ n'ụlọ ikpe di n' Abuja abiaghị n'ụlọ ikpe ụbọchị ịrị abụọ na abụọ nke ọnwa Jenuwarị dịka okwesịrị n'ihi ejighị ahụ ike.