Onye bụbụ onyeisi Imo Broadcasting Corporation ewerela mma sụgbuo nwunye ya

Uweojii Nigeria

Ebe foto si, Getty Images

Ihe na-ajụ obi oyi mere n'ụbọchị Satọde, ụbọchị 23 nke ọnwa Mee, n'obodo Imerienwe dị n'Imo steeti, dịka onye bụbụ onyeisi ụlọọrụ Imo Broadcasting Corporation (IBC) gburu nwunye ya na be ha.

Otu onye obodo ahụ gwara BBC na amatabeghi etu ihe a jiri mee, karịa na ọ bụ nwoke ahụ a na-eche na ọ dị afọ iri asatọ na abụọ gburu nwunye ya ruru afọ iri asatọ.

Nchọpụta BBC bụkwa na ndị a ebiela dịka di na nwunye ihe gafere afọ iri ise, tupu ihe a emee.

Godson Orlando Ikeokwu bu ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti Imo, kwuru na ihe a mere n'eziokwu ma sịkwa na ha ga-amalite nchọpụta isi na ọdụ ihe a mere.

Onye ọzọ si Imerienwe gwara BBC na ihe a mere gbara obodo ahụ niile gharị, makana nwoke ahụ bụ onye ama dịka onye aka ya kwụ ọtọ ma bụrụkwa onye na-eme nwayọ nwayọ.

"Mmadụ niile na-eru uju ugbua. Nwoke a bụ onye umeala anyị na-akpọ Nna anyị Ukwu."

Onye a gwakwara BBC na nwa TC Okere bịara kpọrọ ya pụọ n'obodo ahụ, ma sịkwa na ọ bụ ka e bu nwaanyị ahụ aga ụlọọgwụ dịka a sụchara ya mma ahụ, ka ọ nwụrụ.

Maazị Ikeokwu na onwe ya gwara BBC na ha ejidela nwoke ahụ, ma kpọrọ gawa ụlọ ọrụ ha.

Ọ sịkwa na afọ ole Maazi Okere dị bụ iri asatọ na abụọ n'eziokwu.