Nwunye m wakporo m n'ime afọ iri - Nwoke a wakporo

Nwoke a na-emegbu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọ bụghị nwoke kọrọ akụkọ a nọ n'ime foto a
    • Onye dere ya, Viktoriia Zhuhan, Yana Gribovskaya, and Denis Korolev.
    • Ndị mere akụkọ a, BBC News Ukrainian and Russian

Otu n'ime ụmụ nwaanyị atọ ọbụla agabigala mwakpo n'ike maọbụ mmegbu n'ụlọ na ndụ ha dịka UN si kwuo.

Mana ọ bụghị ihe a ma ama ma nwoke kwuputa ihe ọ gabigara n'ihi mwakpo n'ụlọ.

Mwakpo maọbụ mmegbu n'ụlọ metụtara ụmụ nwoke dịka akụkọ anaghị eji ntị anụ nke mere na ụmụ nwoke na-agabiga ya anaghị ekwuputa ya.

Otu nwoke si mba Yukrane n'achọghị ka ekwuputa onye ọ bụ kọrọ BBC akụkọ ya.

Lee ihe ọ gwara anyị nakwa ndụmọdụ anyị na nwetara n'aka ndị ọkachamara n'etu ị ga-esi chọpụta njirimara mwakpo n'ụlọ.

Eserese gosiri ebe nwaanyí na-achọ ị gbape ụzọ nwoke nọ n'azụ ya

Etu o si bido

A maghị m ma ndị enyi m aghọtara ihe na-eme. Ihe niile dị ka ọ dị mma: anyị na-atọ, anyị nwere ego, nwee enyi. Anyị gakọrọ ọtụtụ njem ọnụ.

Egwu anaghị atụ m mgbe anyị na-aga njem, o nweghi ihe ọ na-eme m. Ụjọ na-abịa mgbe sọsọ anyị nọrọ n'onwe anyị.

Aka ji ekwentị ebe foto gosiri otu nwoke na ọyị ya nwaanyị

O tebeghi aka m chọpụtara na nwunye m ochie na-awakpo m n'ime afọ iri.

Ira bụ nwaanyị mbụ m. Anyị zutere onwe anyị mgbe anyị dị n'afọ iri abụọ, ọ bụ ya jụrụ m ọyị.

Nne m na nna m gwara m na m ga-apụ n'ụlọ ngwangwa ma ọ bụrụ na m mmalite ịyị onye ọbụla ọyị. N'ime otu ụbọchị ma ezinaụlọ ma ebe obibi efunarị m.

O mere ka ụjọ banye m. Sọsọ mgbe m dokọrọ ego ruru ọnụ tupu e nweem ike ịyị onye ọbụla.

Eserese onye nọ dịka nwa dị n'ime afọ

'A tọrọ m atọ'

O nwere mgbe m chọrọ ị ga mba ofesi maka ọrụ m. Ụjọ Ira ịgbala hụ m ji m, m were si ya soro m.

Ọ jụrụ mana o mechara kweta. Mgbe ahụ ka o bidoro.

M na-arụsi ọrụ ike chọọ ezumike mana ọ chọrọ ka anyị nwee mmekọ ahụ. E kwere m ugboro abụọ ma sị ya n'achọrọ m ezumike mana ọ ga-asị m "achọrọ m ya, ị ga-enye m ya, o teela aka m ji eche gị".

Mgbe ahụ o tie m ihe, o nweghi ihe m ga-ekwu. Ọ ga-eji mbọ kawa m ahụ rue mgbe ọbara ga-agbapụta, kụọ m ọkpọ.

Ọ gaghị-akakasị m ihu, sọsọ ebe m nwereikpe ịkpuchi dịka azụ m, aka m nakwa obi m.

O nweghi ihe m menwuru n'ihi na ekwenyeghị m n'iti nwaanyị ihe.

Mmadú gbanyere aka n'isi

Ebe foto si, Getty Images

'A nwara m ịpụ mana enweghị m ike ya'

A laghachiri m be nne m na nna m, achọzịghị m iji anya ahụ Ira. Mana mpụta na ya bụ ọyị riri m ọtụtụ afọ.

Mgbe anyị ga-alụ ọgụ, m ga-agbanyụ ekwentị m zoo; mana ọ ga-abịa nọrọ n'akụkụ ụzọ na-arịọ m na ihe niile ga-adị mma.

M mechaa lakwuru ya. A na m atụ ụjọ ị nọrọ onwe m.

Mgbe o bidoro, achọrọ m ịhapụ ya mana emeghizi m y an'oge. E kwusiri m ike na-anyị ga-alụ n'agbanyeghị na achọghịzị m ya.

line

Gịnị mere ndị a na-emegbu enweghi ike ịgbalahụ ndị na-emegbu ha?

Nwaanyí ji isi ya n'aka

Ebe foto si, Press Association

  • Ndị mmadụ toro n'ezinaụlọ ebe a na-alụ ọgụ nwereike ịme otu ihe ahụ n'ezinaụlọ nke ha.
  • Ụjọ ị nọ sọsọ onwe ha, ihere, echeiche gbasara "ihe ndị mmadụ ga-ekwu" "ụmụaka kwesiri ị nọ n'ezinaụlọ nwere nne na nna"
  • Mbido ya bụ mmegbu metụtara echiche mmadụ anaghị egosi ya mere na ọ ga-amara onye emegburu n'ụzọ a ahụ.
  • Onye a na-emegbu nwereike ịdabere n'elu onye na-emegbu ya maka ego maọbụ ụlọ obibi, iji maatụ nwaanyị dị ime maọbụ nwatakịrị.
  • Ụfọdụ oge, ha chọọ enyemaka n'aka ndị isi ọchịchị, ha na-eji "nke a bụ nke ezinaụlọ" were ekpuchi ya.

Alyona Kryvuliak, bụ onyeisi La Strada-Ukraine National Hotline Department, na Olena Kochemyrovska, onye ndụmọdụ UN n'ihe gbasara ego ọha nakwa ịmegide mmegbu n'ime ụlọ bụ ndị depụtara nke a nakwa ihe ndị ọzọ.

line

'E bidoro m ịkwu okwu, akwụsịnwughị m'

Ị nọrọ n'ọnọdụ dị etu ahụ, ị gaghị aghọta ihe na-eme gị.

O nweghi ụzọ mnwereonwe ị ga-ahụ, ịchee echiche ịgbapụ ọ dị gị ka onweghi olileanya dị ya.

Mgbe niile, a na m eche na ọ bụghị mụ nwe onwe m ya mere m ji were onwe m chụọ aja.

Mgbe ahụ, ọ dị m ka ihe m na-eme adị mma n'ihi ọyị m na-ayị.

Mmadụ na-adabanye n'ime mmiri echieche ọjọọ

Mgbe ọbụla ụjọ jidere m, m gbapụ ọsọ, gaa zo maọbụ si n'ụlọ gbapụ.

Ira chere na m nwere nsogbu mmekọahụ nke mere na ọ na-akpọgara m dọkịta mmekọahụ kwa ọtụtụ afọ.