Resident Doctors' Strike: Ndị dọkinta Enugwu esorola ibe ha malite abụbọọrụ

Ụlọgwụ Parklane dị n'Engwu
    • Onye dere ya, Ebere Ekeopara
    • Ndị mere akụkọ a, Reporter, Igbo Service

Ndị dọkịta na-arụ na ụlọọgwụ nke gọọmenti n'Enugwu steeti esorola ndị ogbo ha na Naijiria niile bagide abụbọọrụ.

Nchọpụta nke BBC Igbo mere gosiri na ndị dọkịta na-arụ na ụlọgwụ Parklane Hospital, UNTH nakwa Orthopadic Engwu sonyere n'abụbọọrụ ahụ.

Esut Parklane Hospital

Onyeisi otu ndị dọkịta('Resident Doctors) na-arụ na Parklane General Hospital bụ Chima Edoga gwara BBC Igbo na ọ bụ iji gbasoo ntuziaka nke otu ahụ nyere ndị dọkịta na Naijiria.

Mgbe BBC rutere na ụlọọgwụ Parklane Enugwu, ebe niile tọgbọrọ chakoo n'ihi na ọ bụ nanị ndi isi dọkịnta na-arụ ọrụ.

'Maternity Ward'

Ọtụ nwaanyị bịara ya bụ ụlọọgwụ aha ya bụ oriakụ Onyinye Okoye kwara arịrị na ka mgbe isi ụtụtụ ka ya bịara ụlọọgwụ ahụ, were nụ na abụbọ ọrụ ahụ dị ire.

O kwuru na ha agwaala ya na ndị ọzọ ka ha lawa n'ihi na ọrịa ha abụghị nke gbagbata.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: