A tọhapụla Pastọ dara iwu COVID-19 n'Ebonyi steeti

Ebelebe gburu n'Ebonyi steeti ụnyaahụ mgbe ndị ọrụ gọọmentị na-ahụ maka ọrịa coronavirus gakwutere otu Pastọ dara iwu ọrụ ha.
Bishop Dan Obinegbo bụ onyeisi nchụaja ndị Christain Victory Prayer Ministry, Abakaliki kabigara ụka awa ole iwu kwuru.
Iwu gọọmentị steeti ahụ sị ka ụka ghara ịgafe elekere iri na abụọ nke ehihie, mana ya bụ ụkọchukwu gafere ya bụ oge.
Mgbe ama gbaara ndị kọmitii COVID-19 na steeti ahụ, Stanley Okoro-Emegha bụ Kọmishọna na ahụ maka nchekwa obodo na okeala gara ebe ahụ ịkwụsị ya ụka, mana akụkọ kọrọ na ọ gbara isiakwara.
Nke a mere Okoro-Emegha ji nye iwu ka a kpụrụ ya gawa n'ogige nchekwa mgbe ọ kachara ụka mgbe ọ gafere elekere abụọ nke ehihie, ebe a ga-enyocha ma o bu ya bụ nje coronavirus.
Ekwesiri isi ebe ahụ kpọga ya na ndị otu ya n'ogige ndopu bụ ebe ọ ga-anọ izuụka abụọ.

Ebe foto si, Ebonyi state Press
Mana Kọmishọna Okoro-Emegha sị na Gọvanọ sị ka atọhapụ ha n'ụtụtụ a ma kpochie ụlọụka ha.
Umahi mechiburu ụlọikpe niile dị n'Ebonyi steeti dịka otu onye nwuru n'ọrịa coronavirus.
Mana gọọmentị sị na onye ahụ nwụrụ abụghị onye ọrụ ndị ụlọikpe mana ha mechiri ụlọikpe ka ha nwee ike sachaa ebe ahụ.
Ọnụọgụgụ ndị bu nje coronavirus na-agbali elu n'ike n'ike n'Ebonyi steeti.
Mmadụ 68 ka a hụrụ nje a n'ahụ ha ụbọchị Sọnde dịka ngalaba NCDC si kwupụta.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:









