Ruga: Nwuchienụ ndị 'Northern Coalition' maka okwu asị - Ndị ọkaiwu

Ebe foto si, Getty Images
Ndi ọkammụta n'ihe gbasara iwu Naijiria ekwuola na okwu ndị otu ndị Ugwu a kpọrọ 'Northern Coalition' kwuru bụ "okwu asị" nke nwere ike ibute "ọgbaghara" maọbụ "agha" n'ala Naijiria.
Ha gara n'ihu kpọọ oku ka ndị uweojii na ndị uweojii nzuzo nke a kpọrọ DSS n'aha ịchafụ nwuchie ha.
Otu ndị Ugwu dị icheiche gbakọtara ọnụ nye ndị gọvanọ ekweghị na'atụmatụ RUGA abali 30 iji gbanwe echiche ha, ọ bụghị otu ahụ, ha enye ndị abụghị ndị Ugwu bi n'Ugwu Naijiria ọsọ.
Ha nyere iwu ahụ dịka gọọmenti etiti kwupụtachara na ha agbaala jim n'atụmatụ inye ndị ọchiehi ala na steeti dị iche iche na Naijiria.
Mana Ọkaiwu Ifeanyị Olumba kwuru na okwu ahụ bụ 'Okwu nwere ike ibute agha."
"Ụdị okwu ahụ na-amụnye obodo ọkụ. Ha na-eme ka ebe gọọmenti adịghị.
"Ndị uweojii na ndị DSS ga-aga lebanye anya, kpọrọ ndị ahụ gaa ụlọikpe."
Ọ gara n'ihu kwuo, "Ọ bụrụ n'ọ bụ ndị Ipob kwuru ụdị ihe, e buru ụgbọ aha ga-izute ha."
N'otu aka ahụ, Ọkaiwu Chima Nnaji kwuru na "ihe ha kwuru bụ ihe megidere iwu. Ọ bụ okwu asị."
"Ọ karịrị okwu asị n'ihi na ọ bụ ihe iwu kpọrọ 'treason.' na Bekee. O kwesịrị ka ndị uweojii na ndị DSS wakpo ha ebe ha gbakọrọ na-ekwu ihe ahụ."
Nnaji boro gọọmenti etiti ebubo anaghị eme onye ka e mere ibe ya na-etu ha si agbaso okwu asị.
"Ọ bụrụ Nnamdi Kanu, ọ bụghị na m na akwado ya, ha chọwa ya ka ha tụkpuo ya na nga. Mana anyị ma na o nweghị ihe a ga-eme."
O kwukwara na ihe ha mere gosiri na Naijiria akpụọla afọ n'ala.









