Herders - farmers conflict in Ngeria: A kwụghị anyị ụgwọ ugbo anyị ndị ọchịehi mebiri- Ndị ntoroọbịa Obohia Ndoki

Ehi na-ata ihe n'ime ọhịa

Ebe foto si, Ukaegbu Chinenye

Ndị obodo Obohia Ndoki dị n'okpuru ọchịchị Ụkwa East Abia Steeti ekwuola na gọọmentị kwesiri iti ha aka n'obi maka ugbo ha ndị ọchịehi mebiri.

Onyeisi ndị ntoroọbịa n'obodo ahụ bụ Ukaegbu Chinenye gwara BBC Igbo na ọ dịla anya ehi a ndị malitere ịta ihe ndị a kụrụ n'ugbo.

Na ha e meela mkpesa nye ndị ọrụ nchekwa gụnyere uweojii, ndị agha, ndị DSS, gọọmentị nakwa ndị ọzọ mana o nweghi ihe e mere banyere a.

O kwuru na ọ bụ na Satọde, mgbe ụfọdụ ndị ntoroọbịa chụrụ ndị ọchịehi ọsọ mgbe ehi ha na-ata ihe ha kụrụ n'ime ugbo ha.

Ndị ọchịehi ahụ hapụrụ ehi ha ma gbaa ọsọ, mgbe ha lọgharachịrị, ha boro ndị obodo ebubo igbu otu ehi ha nke butere ọgbaghara n'obodo.

Ehi na-ata ihe n'ime ọhịa

Ebe foto si, Ukaegbu Chinenye

O kwuru na ndị ọchịehi kpọrọ ndị obodo ha ndị uweojii nakwa ndị agha ma sị ha kwụọ ụgwọ ehi ahụ.

Mana Chinenye gara n'ihu kwuo na onweghi ehi ọbụla ndị ntoroọbịa obodo Obohia Ndoki gburu.

Cheta na Gọvanọ Okezie Ikpeazu mechara kwụọ ndị ọchịehi ahụ ego dị otu puku narị naịra na iri asaa maka ehi ahụ a sị na e gburu.

Nke a mere ndị obodo ji ewe iwe na-ajụ, "Kedụ ihe a ga-eme maka ugbo anyị nke ehi ndị ọchịehi mebiri?"

Aha onyonyo, Odeakwụkwọ Mgbasaozi Abia State.

Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ odeakwụkwọ mgbasaozi nke Abia Steeti bụ Onyebuchi Ememanka maka ajụjụ a ndị obodo na-ajụ.

O kwuru na gọọmentị Abia Steeti a nataghị mkpesa banyere mmebi ihe n'ugbo kama na ọ bụ nke naanị na e gburu ehi.

O kwuru na ọ ga-akpọtụrụ onyeisioche okpuruọchịchị Ụkwa East bụ O. C Nwamuo, iji mara ma ụdị mkpesa ahụ ọ dị.

Ememanka gara n'ihu kwuo na ọ bụrụ na nke a bụ eziokwu na gọọmentị Abia Steeti ga-akwụ ndị ọrụugbo e mebiri ihe ha ụgwọ.

Akụkọ ga-amasị gị: