A kwụsịtụla ikutu ụlọ ndị mmadụ n'Abule Ado Legọs ma malite inyocha akwụkwọ ha

Ụlọ ndị mmadụ a kuturu

Ụlọọrụ na-ahụ maka etu e si arụ ụlọ na Naịjirịa bụ Federal Housing Authority (FHA) ekwuola na ọ bụghị naanị ụlọ ndị Igbo nwee ka a kuturu na mpaghara Abule Ado dị na Legọs Steeti.

Otu onye ọkwa ya dị elu n’ụlọọrụ ahụ na-achọghị ka a kpọọ ya aha gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na ndị nke a kachasị metụta bụ Igbo kama na o nwekwara ndị agbụrụ ọzọ a kuturu ụlọ ha.

Ihe ndị ọzọ o kwuru gụnyere;

  • O kwuru na ndị nwe ụlọ ndị a esoghi usoro ntọala gọọmentị nyere maka iji arụ ụlọ ebe ahụ, na ụfọdụ ha rụrụ ụlọ n’okpuru ụdọ ọkụ latrik.
  • O kwuru na ha anataghi ikike n’aka ụlọọrụ FHA, ebe ọtụtụ ha zụtara ala n’aka ndị agboro maọbụ ndị a kpọrọ Omonile.
  • O kwuru na ha kuturu ụlọ ụfọdụ n’afọ 2021 ma dọọ ndị mmadụ aka na ntị maka ịzụ ala nakwa ịrụ ụlọ ebe ahụ mana o juru ha anya etu e si arụ ụlọ aghara aghara ebe ahụ.
  • O kwuru na ụlọọrụ FHA anaghị ere ala kama na ha na-enye ụlọọrụ nakwa ndị mmadụ ala maka iji ya eme ihe dị iche iche.
  • O kwuru na ha chọpụtara na ụfọ ndị ọkaiwu na ndị agboro (Omonile) na-agbakọ aka ọnụ na-eresi ndị mmadụ ala n’ụzọ na-ezighi ezi.
  • Ọ gara n’ihu dọọ ndị mmadụ aka na ntị na onye ọbụla chọrọ ịzụ ala were akwụkwọ ala ahụ gaa n’ụlọọrụ Surveyor general maka nyocha ala ahụ.
  • O kwuru na dịka ọ dị ugbua na a kwụsịla ikutu ụlọ ndị mmadụ ma malite nyocha akwụkwọ ha jiri zụọ ala ebe ahụ.
Sịnetọ Victor Umeh na Ghenga Ashafa

Ebe foto si, Screenshot

Ihe ndị anya hụrụ ka o si mee kwuru

Ụlọ a mawapụtara maka nkutu

Ndị mmadụ gọọmentị kwaturu ụlọ ha n'Abule Ado dị n'okpuru ọchịchị Amuwo Odofin nke Legọs Steeti akpọọla ndị na-ekpoko ngwongwo ka ha bukọrọ ihe ndị ha nwereike iwepụta n'ụlọ ha ndị a kwaturu.

Ihe a ka BBC Igbo hụrụ ka abalị anọ gachara gọọmentị kwaturu ụlọ ndị mmadụ na mpaghara steeti ahụ maka ebubo na ụlọ ndị ahụ etozughi iwu gọọmentị.

Mana ajụjụ ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ bụ onye kwaturu ụlọ ndị ahụ, gọọmenti etiti ka ọ bụ gọọmentị steeti?

ụlọ ndị a kwaturu akwatu
Nkọwa foto, Ụlọ ndị a kwaturu akwatu

Ihe ndị ọzọ BBC Igbo chọpụtara n'ebe a kuturu ụlọ ndị mmadụ

Nchọpụta BBC Igbo gosiri na ọ bụ ụlọọrụ na-ahụ maka ụlọ na Naịjirịa a kpọrọ Federal Housing Authority (FHA) n'ịchafụ bụ ndị kwaturu ụlọ ndị ahụ.

Ụlọọrụ a si na gọọmentị etiti nke ọrụ ha bụ ịhụ na ụlọ a na-arụ n'ala gọọmentị etiti tozuru usoro e wepụtara a ga-eji rụọ ya na steeti dị icheiche.

Akụkọ kwuru na ụlọ ndị ahụ etozughi usoro e wepụtara maka idozi steeti Legọs.

Ụlọ ndị a kwaturu
Nkọwa foto, Ụlọ ndị a kwaturu akwatu

Otu onye injinịa na-arụ ọrụ n'ebe a kwaturu ụlọ ndị ahụ ma bụrụkwa onye rụrụ otu n'ime ụlọ ndị a kwaturu bụ Prince Nosike kwuru na ọtụtụ n'ime ụlọ ndị ahụ a kwaturu bụ nke a rụrụ ebe gọọmetị etiti mapụtara a kpọrọ 9th Avenue maọbụ nke na-amabanye n'ụzọ road 91.

O kwuru na e zibuola ndị nwe ụlọ ndị ahụ ozi ma dọọ ha aka na ntị na e nwereike ikwatu ụlọ ha kamgbe ọnwa Disemba afọ 2021 nakwa n'ọnwa Ọgọstụ afọ 2023.

Nosike gwara BBC Igbo na nsogbu ndị rụrụ ụlọ ahụ nwere bụ na ha dara iwu banyere etu e si ahazi steeti nke sitere n'aka ndị zụtara ala maọbụ ndị natara ikike ala ha n'aka ndị 'agbero' maọbụ ndị a na-akpọ ndị 'omonile' n'asụsụ Yoroba nakwa ndị na-atụ mgbere ala.

Ebe a kwaturu ụlọ
Nkọwa foto, Ebe a kwaturu ụlọ n'Abule Ado

Etu ihe si kwụrụ ugbua

Ụlọọrụ Federal Housing Authority (FHA) dị n'okporoụzọ 211 chere ihu n'okproụzọ 21 na C close dị na Festac Town, Legọọs
Nkọwa foto, Onye ntaakụkọ BBC Igbo hụrụ ndị wetara akwụkwọ ha ka e mee nnyocha

N'aka nke ọzọ otu ihe onyonyo gosiri ka Sịnetọ Victor Umeh na-anọchiteanya Anambra Central n'ụlọomeiwu Naịjirịa gara n'isiụlọọrụ FHA dị n'Abuja ma zute onyeisi ha bụ Gbenga Ashafa maka etu a ga-esi mezie ma kwụsị ikutu ụlọ ndị mmadụ n'Abule-Ado.

Skip Facebook post
Hapụ Facebook ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Facebook. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Facebook iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of Facebook post

N'ihe onyonyo ahụ, Sịnetọ Umeh kwuru na ọ bụrụ na ọ bịara njem a kamgbe na ihe a gaara egbo nsogbu a kamgbe.

Ashafa zaghachịrị ma sị n'ezie na onyeisi ya maara ihe a ga-eme iji hụụ na e gboro nsogbu a bụkwanụ nke ha mere ugbua.

Ọ gara n'ihu kwuo na ha ezigala ozi na Legọs banyere mkpebi ha nwere sị ka a kwụsị ikutu ụlọ ndị a ma soro ụzọ udo mezie ihe na-eme ebe ahụ.

O kwuru na tupu ngwụcha izuụka a, na ihe niile ga-adịcha mma na udo ga-alọghachị.

BBC Igbo kpọtụụrụ Sịneto Umeh ịchọpụta ihe ndị ọzọ dị na nkwekọrịta ya na FHA nwere mana ọ zabeghi tupu akụkọ a apụta.