Etu ndị ojiegbe si gbuo mmadụ aghara aghara n’Imo steeti n’ime izuụka abụọ

Ndị ojiegbe

Ebe foto si, Getty Images

Kamgbe izuụka abụọ gara aga n'Imo steeti, ọtụtụ ndị mmadu alaala n'ịyị site n'aka ndi ojiegbe a na-amaghị ndị ha bụ.

Ndị ojiegbe gburu Eze Obodo, onye ji egọ achụnta ego, onye uweojii ji ọkwa DPỌ na ndị ọzọ amaghị aha ha.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii ekwụrụ ndị uweojii okwu n'Imo steeti bụ Henry Okey kwụrụ na aka akparala mmadu ịrị na asatọ bụ ndị e chere na aka ha dị n'ogbugbu onye DPỌ ndị uweojii ahụ n'Ahiazu Mbaise.

O kwuru na ndị ahụ e jidere na-enyere ndi uweojii aka ijide ndị omekaome ndị ọzọ.

Mgbe BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru gọọmentị Imo steeti bụ Declan Emelumba n'ekwentị, ọ kwuru na ya anọghị ebe ya ga-ekwụ ọkwụ gbasara nchekwa n'Imo steeti.

Ụgbọala gbara ọkụ n'Imo steeti

Akukọ ndị e gburu n'Imo Steeti kamgbe izuụka abụọ gara aga gụnyere;

Linus Mmuo a na-akpọ Sakatan bu oji egbo achụ nta ego ka akukọ kwuru na e gbụrụ n'ụlọ nna ya bụ Umuezikegbu Egbuoma dị n'okpuruọchịchị Oguta n'ubochi Tọzde 30 Nọvemba 2023. Ndị uweojii kwuru na ha enwetebeghi ozi banyere nke a mgbe BBC Igbo jụrụ ha ajụjụ.

Onye uweojii ji ọkwa DPO n'Ahiazu Mbaise na onye ọzọ - Akụkọ kwuru na e gburu ndị uweojii abụọ gụnyere onye ji ọkwa DPO na Mọnde 28 Nọvemba 2023. Ndị uweojii emebeghị ka a mara aha ha.

A hụrụ ozu Eze Joe Ochulor bụ Eze ọdịnala nke obodo Otulu Ezinihite Mbaise na Satọde, 25 Nọvemba 2023. Ndị ojiegbe tọọrọ Eze ahụ n'ụlọ ya n'isi ụtụtụ ụbọchị Satọde ahụ ma a hụụ ozu ya na mgbede.

Ndị ojiegbe gbukwara Chiedoziem Anyanwu bu onyeisi otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị PDP na mpaghara Ife/Akpodim/Chokoneze nke okpuruọchịchị Mbaise. Ha gburu nwamadị a n'ihu ụlọ ya.

N'aka nke ọzọ ndị ntọrị tọọrọ Fada Kingsley Eze nke ụlọụka St Michaels Katọlik dị n'obodo Umuekebi nke Osuoweerre dị n'Isiala Mbano.

A tọọrọ ụkọchukwu a e ji Fada Ichie maara na otu onye ọzọ n'ụbọchị Tọzde 30 Nọvemba 2023 n'ebe a kpọrọ Orie ama 'junction' n'ihe dịka elekere asatọ nke abalị.

Ndị ojiegbe ahụ zukwara ọtụtụ ndị mmadụ nwere ụlọahịa na gburu gburu ebe ahụ ohi tupu ha apụọ.

Ọnọdụ nchekwa n'Imo steeti

Ndị na-akwado ndị omekome

Ebe foto si, BBC Igbo Screenshot

Kamgbe afọ ole na ole gara aga, ọnọdụ nchekwa abụrụla ihe dị njọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nke Naịjirịa nke Imo so na steeti ebe ọkachasị njọ.

Nke a ebutela ogbugbu ọtụtụ ndị uweojii, ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị ji ọkwa na gọọmentị, ndị Eze ọdịnala nakwa ndị nkịtị, tinyekwara ndị ojiegbe a n'onwe ha.

Nke a na-abịa dịka otu chọro nwereonwe Biafra bụ Indigenous People of Biafra (Ipob) na-akpọ oku ka gọọmentị Naịjirịa tọhapụ onyendu ha bụ Nnamdi Kanu, onye a nwụchiri na Kenya ma kpọlata na Naịjirịa kamgbe afọ 2021.

Ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ na-arụ aka na ọ bụ ndị Ipob na-akpa ike ndị a mana ọnụ na-ekwuru ha bụ Emma Powerful ekwuola ugboro ugboro na aka ha adịghị na mwakpo niile ahụ.