Etu anyị si tụọ ogbunigwe n’ogige ndị Ipob/ESN n’Anambra nakwa Imo steeti - Ndịagha ụgbọelu

Ebe foto si, Other
Ndịagha ụgbọelu Naịjirịa ekwuola na ha tụrụ ogbunigwe n’ogige ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) na Eastern Security Network (ESN) nke dị n’Anambra nakwa Imo steeti n’ụbọchị Tuzde 26 Sepụtemba 2023.
Nke a dị n’akwụkwọ ozi onye mgbasaozi ndịagha ụgbọelu bụ Edward Gabkwet wepụtara ma sị na nke a bụ iji kụsaa nkata ndị otu na-akpa n’ogige ndị a.
O kwuru na ebe ndị a tụrụ ogbunigwe a gụnyere ndagwuru ugwu dị n’ọhịa Orsumughu dị n’okpuruọchịchị Nnewi South nke Anambra Steeti nakwa ọhịa Aku Ihube dị n’okpuruọchịchị Okigwe mke Imo steeti.
O kwuru na ndịagha nwetere ozi na ndị otu a nọ n’ogige ndị a akpa nkata ịwakpo ndị mmadụ n’Anambra, Imo nakwa ebe mpaghara ndị ọzọ dị n’Ọwụwa Anyanwụ.
“Site na mgbakọta aka enyemaka ndịagha ụgbọelu nọ n’ọrụ n’atụmatụ a kpọrọ ‘Udo Ka II’ na ndịagha nọ n’ala nakwa ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ ka e ji tụọ ogbunigwe n’ogige ndị a”.
Gabkwet gara n’ihu kwuo na ogbunigwe mere ọfụma site n’ọkụ a hụrụ na-agba n’ogige ahụ, ndị otu a hụrụ ka ha na-agba ọsọ nakwa ama ndị mmadụ gbara.
O kwuru na ndịagha ụgbọelu nakwa ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ agaghị ada mba na mbọ ha na-agba n’ichekwa Naịjirịa ma gwa ọha na eze ka ha gaa mkpa dịịrị ha na-atụghị egwu ọbụla.
Nke a abụghị mbụ ndịagha na-atụ ogbunigwe n’ogige ndị e chere bụ IPOB/ESN, n’ọnwa Ọgọọst gara aga ha tụkwara ogbunigwe n’ogige ndị otu a dị n’Orsumughu, Anambra Steeti.









