Ihe mere anyị jiri tụọ ogbunigwe n'ọhịa Orsumoghu nakwa ebe ndị ọzọ - Ndịagha ụgbọelu

Ebe foto si, Nigerian Airforce
Ndịagha Ụgbọelu Naịjirịa bụ Nigeria Airforce (NAF) akọwaala ihe mere ha jiri tụọ ogbunigwe n’ime ọhịa dị n’ụfọdụ mpaghara Naịjirịa n’ụbọchị Fraịde 11 Ọgọọst, 2023.
Nkọwa a dị n’akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ngalaba a bụ ọchịagha Edward Gabkwet wepụtara n’ụbọchị Satọde nke kọwara na ha tụrụ ndị a ogbunigwe n’ogige atọ n’otu ụbọchị.
O kwuru na ndịagha ha ji ụgbọelu tụọ ogbunigwe n’ogige ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) na Eastern Security Network (ESN) dị n’ọhịa Orsumoghu nke okpuruọchịchị Ihiala, Anambra Steeti.
O kwuru na mere nyocha ma chọpụta na ndị otu a nọ n’ogige ha na-akpata nkata ma na-akwado ịwakpo ndị mmadụ bi nso n’ebe ahụ na ọ bụ ya mere ha jiri tụbara ha ogbunigwe.
Gabkwet kwuru na ogbunigwe ha tụụrụ mezuru ihe e jiri tụọ ya mana ọ kọwaghị ma o nwere ndị maọbụ onye nwụrụ site na ya.
Nke a abụghị mbụ ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-akwapo ogige ndị Ipob/ESN n’obodo Orsumoghu maka na o so n’ebe ndị ọnọdụ nchekwa dị ọjọọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.
Kamgbe afọ 2021, e nweela ọtụtụ akụkọ banyere ntọrọ na ogbugbu ndị mmadụ gụnyere ndị ọrụ nchekwa na mpaghara Orsumoghu nakwa obodo ndị gbara ya gburu gburu.
N’ihi ya ndị ọrụ nchekwa na-tinyekaarị anya n’obodo ndị a na-ekwu na ndị Ipob/ESN na-enye nsogbu ndị a mana Ipob na-agọ na aka ha adịghị na ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na Facebook. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Facebook iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Facebook post
Ebe ndị ọzọ ndịagha a tụrụ ogbunigwe
Ọchịagha Gabkwet kwuru n’otu ụbọchị ahụ na ndịagha tụkwara ogbunigwe n’ogige ebe a na-esipụta mmanụ agbidi adịgboroja dị n’obodo Bille nke okpuruọchịchị Degema, Rivers steeti.
N’otu aka ahụ, ndịagha ụgbọelu tụkwara ogbunigwe n’ebe nzuzo ndị na-eyi ndụ egwu dị n’obodo Arra nke dị n’akụkụ oke ọhịa Sambisa na mpaghara Ugwu Naịjirịa.
Ha kọwara na nyocha gosiri na ndị oyi ndụ egwu ji nwayọọ na-agbakọta n’ebe ahụ na nso nso a na-agbanyeghi na a chụpụbuola ha na mbụ.
O kwuru na ndị oyi ndụ egwu a bụ ndị gbara ọsọ ndụ site na mpaghara Lake Chad dịka ndị ọrụ nchekwa kwara ha mgbọ.
Na ogbunigwe a ha tụrụ n’obodo Arra mere ọfụma dịka ihe onyonyo gosiri na o gburu ọtụtụ ndị oyi ndụ egwu ebe ọtụrụ n’ime ha gbara ọsọ a ma gbochie ha iwere ọnọdụ obibi ebe ahụ.








