Abacha loot: A hụla ijeri naira 82 ego Abacha zufuru n'ala bekee
Akụkọ ndị dị mkpa:
Abacha loot: A hụla ijeri naira 82 ego Abacha zufuru n'ala bekee

Ebe foto si, AFP/GEtty
Ụlọikpe mba Briten ejichiela ego ruru ijeri naira 82(nde paụnds 211) bụ ego Sani Abacha zufuru site n'ụlọakụ dị na Jersey dị na Channel Island..
Dịka akwụkwọ akụkọ Metro.Uk siri depụta, Abacha onye chịburu Naijiria bido afọ 1993 rue 1998 zipụ ego site na ụlọakụ mba Amerịka.
Ha kwuru na ọ bụ n'aha British Virgin Islands a kpọrọ "Doraville Properties Corporation,'" ka e tinyere ego ahụ.
Cheta na n'afọ 2018, gọọmenti mba Swizzerland nyeghachiri Naijiria nde paunds 300 bụ ego Abacha zupụrụ.
Miyetti Allah: Akụkọ na ndi ọchị ehi na-achọ ịwakpo ala Igbo bụ ụgha

Ebe foto si, Gidado Sidikki
Onye isi otu jikọrọ ndị Fulani na-achị ehi a kpọrọ Miyetti Allah nke mpaghara Ọwụwa-Anyanwu Naijiria ekwuola na akụkọ na ndị Fụlani ọchịehi na-akwado iwakpo ala Igbo bụ ụgha.
Gidado Sidikki, onye kwuru nke a na mkparitauka ya na BBC Igbo sịrị na ndị ọchịehi nọ n'ọwụwa anyanwụ Nigeria enweghi nsogbu ọbụla maka na ha Ndigbo na-ebi n'udo.
Sidikki kwukwara na ọ bụrụ na ndị gọvanọ steeti ndị ọzọ di na Naijiria ga na-eme ka ndi ogbo ha nọ n'Ọwụwa anyanwu, agaghi enwe tigbuo-zọgbụo nile ndị a a na-aṅụ maka ya ebe nile.

Ebe foto si, Getty Images
O kwukwara na emume Sala gara nnọọ nke oma na mpaghara Ọwụwa-Anyanwụ n'ihi na ndị gọvanọ nyere ha nchekwa pụrụ iche nakwa ihe ndị ọzọ dị mkpa.
Abaribe: Ihe Ndigbo chọrọ bụ ka e mee anyị ka e mere ibe anyị

Senetọ na-anọchịte Abia-South n'ụlọomeiwu ukwu bụ Enyinnaya Abaribe ekwuola na ihe kachasị Ndigbo mkpa na Naijiria bụ ka e mee nwata ka e mere ibe n'okwu gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, ikpemkwụmọtọ na nchekwa.
Abaribe onye kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere na nsonso onye jiri Boko Haram na Ipob maa atụ tụrụ arịrị na ndị agbụrụ ndị ọzọ mee ihe ahapụ ha mana Igbo mee ihe, ọ pụọ iche.
Kano State Anti-Corruption Commission: Chụtuonu Sanusi n'ọkwa Emir

Ebe foto si, @Dawisu
Ngalaba gọọmenti Kano na-ahụ maka mkpesa banyere nrụrụaka tụnyeela alo ka akwụsị Emir Kano bụ Sanusi Lamido Sanusi ọrụ n'ike.
Ha na-ebo ya ebubo imefu ijeri N3.4 bido n'afọ 2014 rue 2017.
Mana n'agbanyeghị nghọtahie a dị n'etiti Sanusi na Gọvanọ Kano bụ Ganduje, ha abụọ kerele onwe ha nke ọ ma n'emume oriri Eide Fitr nke Sanusi nọ n'isi ya taa bụ.
Cheta na gọọmenti Kano steeti kewapụtara alaeze (emirate) anọ ọhụrụ ebe ọ bụbu naanị otu na steeti ahụ nke ọtụtụ ndị mmadụ na-arụtụ aka bụ iji kwalata Sanusi nku.

Ebe foto si, @Dawisu
Sanusi dịka Emir nke 'Kano Metropolitan Area' bụ onye duru ndị ụka alaụka nọ na Kano n'emume Eide Fitr nke afọ a.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, AFP
Johanna Konta nke mba Briten emeriela Sloane Stephens were banye n'agba nke ọkara ikpeazụ n'asompi French Open.
Konta onye dị afọ iri abụọ na asatọ ga-ezute Petra Martic nke mba Croatian maọbụ arketa Vondrousova nke mba Czech n'asompi na-abịa.
Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji ebe a:
Willie Obiano ekpogharịala ndị ọrụ gọọmenti

Ebe foto si, GovernorObianoFacebook
Ka anyị bido n'Anambra steeti ebe Gọvanọ Willie Obiano kpoghariri ndị ọrụ kọmishona steeti ahụ ụnyahaụ bụ Monde.
Obiano sị na ọbụghị maka amaghị eme ka ya ji mee nke a kama ọ bụ ka uchu wee batakwa n'ọrụ ọzọ.
Mike Okonkwo onye nọbụ Minịstri na-ahụ maka gburu gburu nọzị Ministri arụm ụlọ ebe Emeka Ezenwanne ga na-ahụzị maka ụmụ akụrụngwa ọha mmadụ ji enyere ndụ aka a kpọrọ 'public utilities' n'asụsụ bekee.
N'otu aka ahụ, Obi Nwankwo bụzị kọmishona na-ahụ maka gburu gburu, Nnamdi Onukwuba ga na-elekota ihe gbasara ọrụ ubi, Afam Mbanefo ga na-ahụ maka ikwalite ndị ntorobia nakwa akụnụba obodo, ebe Bonaventure Enemali na-elekọtazi ihe gbasara ala.
Obiano nyere ndị kọmishọna ọhụụ ahụ izuuka abụọ i ji hazie onwe ha ma bidokwa ọrụ na egbughị oge ọbụla.
Ndị isi na-ekele ndị ụka Alakụba
Chukwuemeka Ihedịoha, Bukola Saraki na ndị isi ndị ọzọ ekelela ndị ụka alakụba maka mmemme ha na-eme taa bụ Eid-Mubarak:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Buhari ekweghị maka uweojii steeti

Ebe foto si, Getty Images
Geenụ nti o, Onyeisiala Muhammadu Buhari sị na onwekweghị mgbe ya ji tinye aka n'akwụkwọ ka ndị steeti obula nwee ndị uweojii nke ha o.
N'aka twitter ya, onyeisiala nyere ọnwa atọ iji lebe anya na ya bụ akwụkwọ nchọpụta edere maka ịhazigharị mpaghara uweojii akpọrọ SARS.
Trump na May ga-ahụ taa

Ebe foto si, Getty Images
Nke na-akpọtụ na mba ụwa taa bụ na Onyeisala mba Amerika bụ Donald Trump ga-enwe mkparịta ụka miri emi ya na Ogbo ya nke Briten bụ Theresa May.
Ha ga-akpa ọtụtụ ihe nke gụnyere mgbanwe mbara ihu igwe Bekee kpọrọ "climate change" taa bụ abali nke abụọ Trump batara UK
Senegal ekwojiela Eagles nku

Ebe foto si, NFF
N'egwuruegwu, ndị egwu bọlụ Senegal akajiela Flying Eagles nku n'ike na asọmpị Fifa ndị erubeghị afọ iri abụọ.
Senegal ji ọkpụ goolụ abụọ asatara otu dulaa Eagles na ya bụ asọmpi.













