Senegal vs Nigeria: Ụmụ ụdụm Senegal agbajiela Flying Eagles nku

Awọn agbabọọlu Naijiria

Ebe foto si, Getty Images

Agbanyeghị na Flying Eagles ji ikikiri eze bata n'agba nke abụọ asọmpị Iko Mba Ụwa nke akpọrọ "Fifa Under 20 World Cup" a na-agba na mba Poland, ndị ha zutere bụ Senegal ekweghi ha ṅụọ mmiri tọgbọ iko.

Naịjirịa ka jide bọọlụ n'agba nke abụọ asọmpị a mana ọ bụ Senegal bu ụzọ dọka neetị mgbe Sanga nyere goolu na nkeji iri atọ na isii.

Na nkeji iri anọ na anọ eche na Naịjirịa nwetere penarịtị mana igwe nchọpụta VAR sị na nke ahụ abụghị eziokwu. Naịjirịa nwetere nke Bekee kpọrọ "free kick".

Ka a kana-ekwu nke mere, ọzọ mekwa na nkeji atọ etinyere agba nke mbụ, Alpa Dioundou hụrụ ụzọ n'aka ekpe were gbanyere Niane boolu oji retere Senegal goolu nke abụọ.

Eji goolu abụo ahụ mechi agba nke mbụ ahụ.

Na nkeji iri ise n'agba nke abụọ Okon ji ngụ kụnye bọọlụ Success Makanjuola gbara jiri nye Naịjirịa goolu nkote ụme.

Ọbụzị Senbegal abụọ, Naịjirịa otu.

Naịjirịa ka jide bọọlụ na-agba nke a, mana ha ahụghị ụkwụ ha ga-eji nye goolu.

Ka asọmpị a na-abị a na njedebe, Senegal kwadoro ịnye goolu abụọ ọzọ mana Oremade, ony enche goolu Naịjirịa nwara kụpụ ha.

Ka ọ kwụ ugbua, ọ bụzị ụla chere Naịjirịa na asọmpị nke afọ a.