Edo PDP Primary Election: Ụlọikpe asịla Obaseki na ndị PDP Edo steeti laa kpezie

Obaseki ka ọ banyere PDP
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ụlọikpe ukwu dị na Pọtakọt akụpụla akwụkwọ a gbara iji kwụsị Godwin Obaseki ịzọgharị ọkwa gọvanọ Edo steeti n'aha otu PDP.

Nke a mere ụbọchị Wenezde dịka ka ndị okwu ahụ metụtara kpebiri ka ha gaa n'ụlọ ga kpezie.

Ọkaiwu onye wetara ikpe bụ Ferdinand Orbih na ndị ọkaiwu ndị ọzọ okwu ahụ metụtara gụnyere Alex Ejesiema,M. E. Ani, Emmanuel Enoidem na Higher King kwetara ka e kpee udo.

Ọkaikpe Jọstis E Obile nyeburu ha awa atọ ka ha gaa zukọta ma kwekọrịta ihe ha chọrọ.

Cheta na Obaseki si APC pụta banye PDP, ndị otu PDP nabatara ya chọọ inye ya ikike ịzọgharị ọkwa gọvanọ n'aha pati ha mana ụfọdụ na PDP chọọ ịzọ ọkwa ahụ jụrụ ajụ ma wepụ okwu ahụ ụlọikpe.

Gọvanọ Nyesom Wike esepula aka n'okwu PDP na Obaseki

Gọvanọ Nysom Wike

Gọvanọ Nyesom Wike nke Rivas Steeti sị na ya esepula aka n'okwu ime udo n'etiti ndị pati PDP n'Edo Steeti.

Wike gwara ndị ntaakụkọ nke a na mgbasaozi o nyere na Pọtakọt ụbọchị Tuzde.(Juun 23,2020)

Nke a na-abịa dịka ọ fọrọ otu ụbọchị ka e mee ntuliaka ime ụlọ iji họpụta onye ga-eji ọkọlọtọ ha azọ ọkwa gọvanọ Edo Steeti.

Wike sị na o mere nke a maka ndị komitii ọrụ na PDP bụ 'National Working Committee' anaghị eme ka a mara ihe ha na-eme.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Ọ sị na ha na-achọ ịgba ya mgba okpuru ma metọsịa aha ya.

Wike sị na ọ gwara ha ka e jiri nwaayọọ mee udo n'Edo Steeti, mee ka onye ọbụla mara ihe a na-eme, na ga-akwanyere ndị mmadụ ugwu na abụghị ime ka ndị ụtụisi.

Godwin Obaseki

Ebe foto si, Getty Images

Godwin Obaseki bụ aha mmadụ niile kpụ n'ọnụ n'ime ụbọchi ole na ole gara aga dịka o si otu ndọrọndọrọ All Progressive Congress (APC) banye nke People's Democratic Party (PDP).

N'ụbọchị 23 nke ọnwa Juun ka ụlọikpe steeti nke dị n'Ekpoma kagburu akwụkwọ onye otu PDP bụ Omorogie Ogbeide-Ihama gbara, nke sị na Obaseki ekwesịghị iso zọọ ntuliaka ime ụlọ maka onye ga-eji ọkọlọtọ PDP zọọ oche gọvanọ nke Edo steeti ebe ụlọikpe elu nke Edo steeti gbochiri Obaseki ị so mee ya bụ ntụlịaka.

Ogbeide-Ihama na-ekwu na Obaseki ka batara otu PDP nsonso a, ma sịkwa na o nwekwara nsogbu n'asambodo ya nke mere ndị APC ji wepụ ya n'ọchịchi.

Mana ebubo ya niile akwụsịghị ụlọikpe ikagbu akwụkwọ ọ gbara maka Obaseki.

Ọnọdụ Obaseki n'otu PDP ugbua

Obaseki ka ọ banyere PDP

N'ụbọchị 19 nke ọnwa Juun ka Obaseki kwuru n'akara Twitter ya na ya abanyela otu PDP.

Nke a mere dịka ndị pati APC wepụrụ ya dịka onye ga-anọchite anya patị ahụ na ndọrọndọrọ ọchịchị Gọvanọ Edo steeti, n'agbanyeghị na ọ bụ Obaseki ka bụ Gọvanọ.

Ndị otu PDP nke gụnyere onye bụbu osote onyeisiala Naijirịa bụ Atiku Abubakar na Nyesom Wike bụ gọvanọ Rivas steeti, nabatara Obaseki nke ọma.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Skip X post, 2

End of X post, 2

Skip X post, 3

End of X post, 3

Skip X post, 4

End of X post, 4

Otu onye ọzọkwa bụ Gideon Ikhine chọburu iji ọkolọtọ PDP zọọ ọchịchị gọvanọ Edo steeti, wepụkwara onwe ya ma nye Obaseki ohere ka o bụrụ ya ga-eji ọkọlọtọ pati ahụ zọọ ya bụ ọchịchị.

Skip X post, 5
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 5

Mana Ogbeide-Ihama gbara akwụkwọ n'ụlọikpe ka a kwụsị Gọvanọ Obaseki isoro mee ntuliaka maka onye ga-eji ọkolotọ PDP zọọ ọchịchị gọvanọ.

Ogbiede-Ihama jụrụ ịpụ n'ụzọ ka Obaseki jiri ọkọlọtọ PDP zọo ọchịchị.

Ka ọ dị ugbua, a na-eche mpụtara ntuliaka ime ụlọ ndị otu PDP ga-eme n'ụbọchị 25 nke ọnwa Juun ka ha mara onye ga-eji ọkọlọtọ PDP zọọ ọchịchi Gọvanọ Edo steeti.

Gịnị chụpụrụ Obaseki n'APC?

Obaseki bụ Gọvanọ nke ise Edo steeti na-enweta dịka ọ ṅụrụ iyi ọrụ n'ụbọchị 12 nke ọnwa Nọvemba afọ 2016.

Obaseki ji ọkọlọtọ otu pati APC were merie Osagie Ize-Iyamu ji ọkọlọtọ PDP na ntuliaka e mere n'ọnwa Sepụtemba 2016.

Dịka Vanessa Obioha bụ onye ntaakụkọ This Day siri dee, nsogbu Obaseki bidoro dịka ọ na-ekweghi ka Adams Oshiomhole bụ onye ọ nọchiri dịka gọvanọ na-atuzi ihe na-eme na ya bụ steeti.

O dere na ịnyere ndị Edo steeti aka bụ ihe kacha masị Obaseki, nke mere na atụmatụ ya niile bụ ka ọ hụ na e ji ego Edo steeti rụọrọ ndị steeti ahụ ọrụ.

Obioha dere na ebe nsogbu ha bidoro bụ mgbe Obaseki wepụrụ ụtụisi nke kwesịrị ịbara steeti uru, nke ọ sị na ọ bụ naanị ụfọdụ mmadụ na-erite uru ya.

Oshiomhole rituru dịka gọvanọ ma bụrụzia onyeisioche otu APC.

Ka Obaseki na Oshiomhole na-ama aka, ụfọdụ ndị otu APC dịka Henry Idahagbon na-ekwu sị "Obaseki bụrụ ezigbo onye ndọrọndọrọ ọchịchị, ọ ga-ewetu onwe ya ala rịọ ndị ọchịchị pati anyị.

Makana e wepụ nkwado anyị, Obaseki agaraghị ịbụ gọvanọ Edo steeti".

Kama ụlọikpe elu nke dị n'Abuja kpebiri ma nye iwu ka e wepụ Adams Oshiomhole dịka onyeisioche otu APC n'ọnwa Maachị 2020.

Nchụpụ ya na-abịa dịka a gbara ya akwụkwọ maka aka ike o ji achị, nrụrụaka ego na erubeghị isi n'iwu.

Oshiomhole wegara ya bụ ikpe n'ụlọikpe mkpegharị, mana mpụtara ya na nke ụlọikpe elu bịara bụrụ otu.

Nke ikpeazụ mere o ji pụọ APC

Ọ bụ nzukọ na-enyocha ndị ga-eji ọkọlọtọ otu APC zọọ ndọrọndọrọ ọchịchị wepụrụ Obaseki na ndị ga-eso mee ntuliaka ime ụlọ ha.

Ndị nzukọ a wepụrụ Obaseki dịka ha sị na asambodo o ji fee ala nna na-egosi "Obasek" kama "Obaseki".

Ha kwukwara na Gọvanọ Obaseki agbaghị mbọ imezi ya bụ mmejọ n'agbanyeghị na o nwereike isi n'aka ngalaba NYSC.

Onye na-ekwuchitere nzukọ a bụ Jonathan Ayuba kwukwara na Obaseki ewetaghị akwụkwọ ndị ọzọ nzụko ahụ sị ya weta.

Kama ya, nzukọ a nyere Ize-Iyamu, Osaro Obaz na Pius Odubu ikike ịzọ onye ga-eji ọkọlọtọ APC zọọ ọchịchi gọvanọ Edo steeti.

Osagie Ize-Iyamu

Ebe foto si, Twitter/Ize-Iyamu

Obaseki na-ekwu na o nweghi ntụkwasị obi ebe nzukọ nnyocha a nọ, n'ihi na ọ bụ Oshiomhole na-agwa ha ihe ha na-eme.

Ọ bụ n'ụbọchị 16 nke ọnwa Juun ka Obaseki gbara arụkwaghịm ma hapụ ndị otu APC; ka ọ na-apụ ka osote ya bụ Philip Shaibu sokwa ya pụọ.

Ka ọ dị ugbua, ọ bụ Ize-Iyamu ,onye ji ọkọlọtọ PDP zọọ ọchịchị gọvanọ Edo steeti n'afọ 2016, ga-ejizi ọkọlọto APC zọọ ya bụ ọkwa n'afọ 2020.

Ebe a na-atụanya na Obaseki ga-eji ọkolotọ PDP zọọ ọchịchị.

Ebe INEC kwụ

Ngalaba na-ahụ maka ntụliaka na Naijirịa bụ Independent National Electoral Commission ekwuola na ihe niile gbasara ịghọpụta onye ga-eji ọkoloto patị ọbụla zọo ọkwa ọchịchị ga-ebi n'ụbọchị 27 nke ọnwa Juun afọ 2020.

Skip X post, 6
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 6