APC Primaries: Azịza ndị APC abaala Osagie Ize-Iyamu n'aka n'Edo steeti

Ebe foto si, Twitter/Ize-Iyamu
Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na Osagie Ize-Iyamu abụrụla onye ga-anọchite anya pati All Progressives Congress (APC) na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Edo steeti.
Nke a na-abịa dịka Hope Uzodinma bụ gọvanọ Imo steeti nakwa onyeisioche na-ahụ maka ntuliaka imeụlọ APC, kwuputere nke a na Benin, Edo steeti.
Uzodinma kwuru na ha ji usoro ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) wepụtara, n'agbanyeghi na ụfọdụ ndị ọzọ zọsara ya ọkwa a kwụsịrị n'ụzọ tupu e mee ya bụ ntuliaka.
Ize-Iyamu bụkwa ụkọchukwu nwetara vootu 27,838 nke mere ya onye mmeri.
Lee etu e si họpụta ya ebe a:
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Etu ntuliaka ime ụlọ APC si gaa n'Edo Steeti

Pati All Progressive Congress (APC) amalitela ntuliaka imeụlọ iji họpụta onye ga-eji ọkọlọtọ ha zọọ ọkwa gọvanọ n'Edo Steetị.
Ntuliaka a na-eme n'ime wọọdụ dị otu narị na iri itoolu na abụọ n'ime okpuru ọchịchị dị iri na asatọ nke Steetị ahụ.
Ndị ọrụ pati ahụ nakwa ndị nnọchịteanya bịara n'oge n'isiụlọọrụ pati ahụ nke wọọdụ 7 nke Oredo dị n'okpuru ọchịchị Benin.
Onyeisioche wọọdụ ahụ bụ Osamudiame Osarenkhoe sị ha na-eso ntuziaka maka mgbochi coronavirus na-eme ntuliaka a.

Ọ sị na e nwere ite mmiri e ji akwọ aka nakwa na onye ọbụ yi akwa mkpuchi ihu.
Na wọọdụ 3 nke dị n'okpuruọchịchị Auchi, ndị otu APC pụtakwara ị bịa binyeaka iji họpụta onye dị ha n'obi.

Akụkọ ka na-abịa...
Kedụ onye bụ onyeisioche APC n'etiti Ajumobi na Gaidom?

Ebe foto si, Instagram/ abiola ajimobi
Egwu agwara ọgwa bụ ihe na-ada n'otu APC dịka Victor Gaidom weghara ọkwa dịka onyeisioche pati ahụ.
Nke a na-eme dịka ndị isi pati ahụ nọrọ ụnyahụ bụ Tuzde wepụta Ajụmọbi bụbu gọvanọ Oyo steeti ka ọ bụrụ onye na-arụ ọrụ dịka onyeisi oche pati ahụ.
Ụlọikpe mkpegharị nọ n'Abuja kpebiri na nchutu ụlọikpe ukwu chutuburu Adams Oshimhole n'ọkwa ahụ bụ ihe dabara adaba.
Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na ndị ọrụ nchekwa e werela ọnọdụ na isiụlọọrụ pati ahụ iji hụ na ọgbaghara adapụtaghị.
Kedu ihe Ajimobi kwuru?
Onye ndị otu APC họpụtara ka ọ bụrụ onyeisi ha bụ omeiwu Abiola Ajimobi ekwuola ka mmadụ niile dere duu.
Onye na-ekwuchitere Ajimobi bụ Bolaji Tunji kwuru sị " Ajimobi kwuru na ọ ga-ekpebi ihe niile mgbe ha ga-enwe nzụkọ pati ha nke ha na-akpọ nzụko "National Executive Council".
Tunji kwukwara na akụkọ na-ekwu na Ajimobi n'ute ọrịa nke 'ọ dị ndụ ọnwụ ka mma' bụ ezigbote asị.
Kama Tunji azaghị eee maọbụ mba maka kepukepu na Ajimobi bu ọrịa coronavirus.
Kedụ kwanụ ebe Victor Giadom kwụ?
Mazi Victor Giadom onye mere onwe ya onyisioche otu pati APC kagburu nyocha nzụkọ patị ahụ hiwere iji nyochaa ndị ha ga-ahọpụta onye ga-azọ ọchịchị Govanọ Edo steeti.
Nzụkọ nyocha a wepụrụ Gọvanọ Godwin Obaseki dịka onye ga-anọchite patị ahụ n'oche gọvanọ Edo steeti, kama Giadom kagburu mpụta nyocha ha dịka ọ mere onwe ya onyeisi.
Giadom kwuru na omegidere okpukpe ikpe ga onye achụpụru dịka onyeisioche patị bụ Adams Oshimole ị sọ mee nyocha n'ihi na onwere ihe ọ ga-erite na ya bụ ikpe.
Gịnị ka ndị patị APC na-ekwu maka ihe ndị a niile?
Ndị otu pati APC depụtara n'akara twiter ha na ọ bụ Abiola Ajimobi ga-arụ ọrụ dịka onyeisioche.
Ha kwuru na nke a bụ maka na ha enyochala iwu patị ha dịka o si dị n'agba nke 14.2 akwụkwọ iwu ha, were kpebie na ọ bụ Ajimobi ga-ewere ọnọdụ dịka onyeisioche.
Ka nke a na-eme ka Gọvanọ Obaseki gbara arụkwaghịm na patị APC dịka ya na onyeisiala Muhammadu Buhari nwere nzụkọ n'Abuja n'ụbọchị Tuzde.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post











