Kanayo O. Kanayo: Ihe m jiri chọọ ịzọ ọkwa n' ụlọomeiwu
Onye ihe nkiri a ma ama bụ Kanayọ O. Kanayo ekwuola na ihe mere ojiri chọọ ịzọ ọkwa ịnọchite mpaghara Ahiazu/Ezinihitte Mbaise n'ụlọoimewu nta bụ iji nye aka imepụta iwu ndị ga na-enyere ndị mpaghara ahụ aka.
Na mkparitaụka ya na BBC Igbo nwere, Kanayo kwuru na ya tozuru etozu ịzọ ọkwa ahụ.
"Obi m zuru ezu; ahụ zuru ezu; ndị be anyị agwala m pụta bịa gara ha ozi."
Nwaafọ ahụ pụtara ihe n'ihe nkiri Igbo wuru ewu a kpọrọ "Living in Bondage" kọwara na ọ bụ ndị mmadụ kpọrọ ya oku bịa fee ọha.