AMVCA 2020: Ndị meriri na ndị e meriri na'emume nke afọ

Ebe foto si, Instagram/Funnybone
Stanley Chibunna eritela nturuugo onye kacha akpa ọchị n'ejije Nollywood.
Chibunna onye e ji Funnybone mara ritere nturuugo a n'emume 'Africa Magic Viewers Choic Awards' nke afọ 2020.
N'okwu ya, Funnybone kwuru na ya na-echeta nne ya onye nke nwụrụ ọnwa olemole gara aga.

Ebe foto si, Instagram/Ramsey Noah
Living in Bondage eturula ugo dịka ejije kacha ibe ya mma na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka n'afọ 2019/2020.
Ya bụ ejije nwetara nturuugo a n'emume 'Africa Magic Viewers Choic Awards' e mere n'ụbọchị Satọde.
Ejije a bụ mmegharị ejije nke mbụ e ji malite Nollywood bụ nke a kpọkwara 'Living in Bondage'.
Onye haziri ejije nke a bụ Ramsey Noah.
Ndị ọzọ sokwa mee ya gụnyere Kenneth Okonkwo, Kanayo O. Kanayo, Bob Manuel Udokwu na ndị ọzọ.

Ebe foto si, Instagram/Victor Iyke
BBC Igbo kwụ chịm dịka a na-etunye ndị gbara mbọ na Nollywood ugwu kwesịrị ha.
N'ime ntuurugo 26 e wepụtara na AMVCA nke afọ a, naanị asaa ka ndị ọha mmadụ nwere ike ịtụrụ vootu.
Lee ka okwe si gbaa:

- Ejije Igbo kacha mma bụ nke a kpọrọ 'Nne' nke onye mere ya bụ Victor Iyke
- Onye meriri onye kacha mara ka e si eme 'Make up' bụ Lilian Omoyele Paul
- Onye meriri 'Best Costume Designer' ejije TV bụ Dimeji Ajibola
- Ndị meriri 'Best Picture Editor' bụ Tosin Igho and Bryan Dike
- Onye meriri 'Best Sound Editor' bụ Christina Aragon
- Ụlọorụ meriri 'Best Lighting Designer' bụ Cardoso
- Onye meriri 'Best Cinematographer' bụ John Demps
- Ihe nkiri ritere nturuugo 'Best Documentary' bụ Beverly Naya
- Nke ritere 'Best soundtrack in a series' bụ Larry Gaga
- Mkpụmkpụ ejije kacha mma bụ nke a kpọrọ 'Thorn'. Onye mere ya bụ Bola Enigma Akanbi
- Ejije mkpaọchị kachc mma bụ 'Truth', nke onye mere ya bụ Anis Halloway









