Coronavirus: Ọnụọgụgụ ụmụnwaanyị na-achọ igbochi ịtụrụ ime na 'lockdown' a ọ na-arị elu?

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist Igbo
Ọ bụ ihe aṅụrị ma nwaanyị lụrụ di tụrụ ime maka na nwa so n'isi sekpuntị na alụmdi na nwunye.
Mana ụfọdụ ụmụnwaayị lụrụ di na-aṅụzị ọgwụ ga-egbochi ha ịtụrụ ime ọkachasị n'oge mmachi ngagharị a n'ihi coronavirus.
N'oge a, ha na di ha na-anọkarị n'ụlọ nakwa enwe mmerịkọta kwa mgbe kwa mgbe, mana ha achọghị ka "aka enwe ghọọ aka mmadụ."


BBC Igbo kpọtụrụ Nọọsụ Comfort Ogu bụ onyeisi nhazi n'ụlọọrụ 'Planned Parenthood Federation of Nigeria' ngalaba Abia Steeti.
Ọ sị na ụmụnwaanyị na-abịa n'ụlọọrụ ha bụ ebe ha na-anara ọgwụ maka nhazi ezinaụlọ bụ 'Family Planning' kamgbe 'lockdown akarịala ndị na-abịa n'oge mbụ.
Ogu kwuru sị: "Na-agbanyeghi na anyị anaghị emepe ụbọchị niile maka mmachi ngagharị, ọtụtụ ụmụnwaanyị na-akpọ anyị n'ekwentị maka ị nara ọgwụ mgbochi ime."
"Ndị na-abịa a nara ọgwụ mgbochi ime ugbua ga-eji ihe ruru pasentị iri isii karịa ndị na-abịa n'oge nkịtị."
Ogu sị na ọgwụ ụmụnwaanyị ndị a na-anara gụnyere ọgwụ ọṅụṅụ, nke ọgbụgba nakwa nke a na-etinye etinye.
BBC Igbo jụrụ otu dọkịta ahụike ụmụnwaanyị bụ Joseph Akinde etu o sị hụta atụmatụ a ụfọdụ ụmụnwaanyị na-agbaso.
Ọ sị na atụmatụ ha a dị mma. "Kama ha ga-atụrụ ime ha achọghị, ọ ka mma ka ha gbochie ya."
"Makana ọ bụ ihe megidere iwu Naịjirịa nakwa ihe ọghọm ite ime ma ọ bụrụ na ha e gbochighi ya."

Ebe foto si, Getty Images
Dọkịta Akinde gara n'ihu kwuo na ọnọdụ akụnaụba ugbua dị ezigbo ọjọọ na onye ọbụla mụrụ nwa ọ na-achọghị na-etinyekwuru n'ezinaụlọ ya nsogbu.
O ruola izuụka atọ gọọmentị etiti nakwa nke steetị dị icheiche machiri ngagharị ndị mmadụ maka ọrịa coronavirus.












