Coronavirus: 'Agụụ ga-egbu anyị na ụmụaka ma gọmenti mechie ahịa n'Enugwu'
Dịka gọọmenti Enugwu na-amalite mmachị ahịa, ụka, njem nakwa ngagharị ọbụla, ụmụ nwaanyị na-azụ ahịa na Akwata arịọla gọọmentị Enugwu steeti ka ọ ghara imechi ahịa kpam kpam.
Ha kwuru na nke a bụ n'ihi na ha enweghị ego ha ga-eji zụọ ụmụ ha nri.
Mgbe BBC rutere na ya bụ ahịa, ndị ahịa ahụ kọwara na ka ha si eri nri bụ site na igota tomato, ose nakwa yabasị kwa ụbọchị, ree ya were nweta ọmụrụ nwa.
Ha rịọrọ gọọmenti ka o nye ha ego iti aka n'obi tupu emechie ahịa ahụ n'izu ụka a, ka agụụ ghara igbu ha na ezinaụlọ ha.

Gọọmenti Enugwu steeti mara iwu ka ahịa, ụlọ ọrụ, ụlọ ụka nakwa njem gbaa bụreki malite echi site na ndị mmadụ ịnọrọ n'ụlọ ha ka ewere buso nje Coronavirus agha.
Onye mere akụkọ a bụ Ebere Ekeopara.

