Ihe mere ụfọdụ mmadụ enweghị ike ibute nje Coronavirus

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ọkachamara na sayensị na-agba mbọ niile ha nwere ike iji ịchọta ọgwụ eji agwọ ọrịa coronavirus.
Mbọ a ha na-agba amịtala mkpụrụ dịka a chọpụtara ọtụtụ ọgwụ bụ nke nnyocha gosiri na o nwere ike igbochi mmadụ ibute ya bụ ọrịa.
Mana dịka a na-agba mbọ niile a, nnyocha miri emi egosila na o nwere ndị na-enweghị ike ibute nje coronavirus.
Nke a bụ maka akụrụngwa pụrụ iche nke dị n'ọbara ha, aha akụrụngwa a bụ 'T-Cells'.
Gịnị bụ T-Cells?

Ebe foto si, Getty Images
E nwere akụrụngwa dị n'ọbara mmadụ nke na-aluso nje ọbụla batara n'ahụ onye ahụ ọgụ.
Akụrụngwa a ka bekee na-akpọ 'white blood cells'.
Ọ bụrụ na mmadụ bute nje dị aṅaa dịka 'virus', akụrụngwa a ge-ebuso nje ahụ agha ma matakwa ya bụ nje ka ọ ga-abụ nje ahụ bịakwa ọzọ, ọ gaghị enwe ike ịmetụta onye ahụ ọz.
Ọ bụ nke a ka bekee na-ekwu na mmadụ enweela 'immunity' gbasara otu nje maọbụ nke ọzọ.
Iji maa atụ, ọrịa 'chicken pox' na-eme mmadụ naanị otu ugboro na ndụ, n'ihi na 'white blood cell' amatala nje na-akpata ọrịa ahụ, ọ gaghị ekwekwa ka nje ahụ metụta onye ahụ ọzọ.
Mana 'T-cells' bụ akụrụngwa pụrụ iche nke nnyocha gosiri na ọ na-ebuso nje coronavirus nakwa ụfọdụ nje ndị ọzọ agha.
Nnyocha gosiri na 'T-Cells' nwere ụdị ihe pụrụ iche kpuchiri ha nke a kpọrọ 'proteins'
'T-Cells' dị n'ahụ mmadụ ruru tarị (trillion) kwuru tarị iji buso nje agha ruo ogologo oge.
Ndị ọkachamara nyochara ọbara a mịpụtara n'ahụ ọtụtụ mmadụ tupu ọrịa coronavirus amalite, ha wee chọpụta na ụfọdụ ọbara ahụ nwere akụrụngwa 'T-Cells' bụ ndị ọrụ ha bụ ibuso nje dịka coronavirus agha.
Nke a gosiri na ụfọdụ mmadụ enweelarị akụrụngwa ga-egbochi ha ibute nje coronavirus tupu ya bụ ọrịa abanyerị n'ahụ mmadụ.
Nnyocha gosiri na mmadụ ruru pasentị iri anọ ruo iri isii (40% to 60%) nwere akụrụngwa 'T-Cells' ndị a n'ahụ ha.
Ndị dị otu a nwere ike ibute nje covid mana owneghị ihe ọ ga-adị ha ka.
Mana...
Oge e nyochara ahụ ụfọdụ mmadụ ndị ọrịa coronavirus mekpara ahụ nke ukwu, a chọpụtara na ahụ ha na-emepụta T-Cells mana ha na-anwụchasị.
Ọ gbara ndị nnyocha ahụ gharịị ihe kpatara ụdị ihe ahụ.
Adrian Hayday, Ọkammụta 'Immunologu' n'ụlọakwụkwọ 'Kings College' kwuru sị: "Anyị amachabeghị ihe na-akpata ya bụ T-Cells ji anwụ n'ime ahụ ụfọdụ mmadụ."
"O doro anyị anya na T-Cells nwere ike inye mmadụ nchekwa ruo ogologo afọ, mana ọ na-adị anyị ka na ọ bụrụ na onye adaala n'ọrịa, T-Cells agaghịkwa enweta onwe ya iji chekwaa onye ahụ."










