Coronavirus Myths: I nwereike ibute coronavirus site na ahụrụ?

Ndị kpuchiri imi ha

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos

Dịka ọria coronavirus na-akpa ike na-aga n'ihu na Naijiria na mbaụwa, kepukepu ọhụrụ na-efegharị ugbua bụ na e nwere ike ibute ọria ọjọọ a site n'ahụrụ.

Mana ndị ọkachamara ahụike gwara BBC lgbo na mkpụrụ adịghị n'ụkwa a ndị na-efesa ya bụ akụkọ na-apị.

coronavirus
coronavirus branding

Kemgbe ọrịa coronavirus pụtara mbụ na Chaịna n'afọ 2019 ruo ugbua, ọria a nke ndị ọkachamara kwuru na a na-ebute site n'ụkwara maọbụ uzere, ataala isi otu ijeri mmadụ na ụma n'ụwa nile.

Aka nile dị n'ọbọ ime nchọpụta maka ya bụ ọrịa, ọkachasị ọgwụ mgbochi na ọgwụgwọ nakwa etu ọrịa si ekesa.

Otu ndọrịtaụka ọhụrụ pụtara n'ịntanetị bụ nkwenye ụfọdụ na mmadụ nwere ike ikuru coronavirus n'ahụrụ onye bu ọrịa a nyụrụ ọkachasị onye eyighị ọbante.

Ọkachamara n'ihe gbasara nje nke Bekee kpọrọ 'virologist' bụ Ọkammụta Oyemade Tomori sị na, "onye na-ekwu ụdị okwu a na-ama njakịrị."

O kwuru na "e nwere ike ịhụ nje a na ngụgụ nakwa akụkụ ndị ọzọ e ji eku ume."

Onye na-aga mposi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụfọdụ ndị ọkacha mara kwuru na e nwer ike ịhụ nje coronavirus na nsị onye bu ya bụ ọrịa

Dọkịta ahụike ọha na 'Lagos University Teaching Hospital' (LUTH), Dkta Bayo Onajole nakwa odeakwụkwọ otu jikọrọ ndị sayentist (Nigeria Academy of Science) bụ Dkta Doyin Odubanjo tinyekwara ọnụ n'ihe Tomori kwuru.

Onajole sị na, "ọ bụghị eziokwu", ebe Odubanjo si na"anụbeghị m ya mbụ".

Mana Odubanjo na Tomori kwuru na nchọpụta gosiri na nje coronavirus nwere ike ịdị na nsị onye bu ya.

Tomori, onye bubu onyeisi NASS sị, "N'ezie, e nwere ike ịhụ ya na nsị."

N'otu aka ahụ, Dkta Odubanjo si, "nchọpụta na-ekwu na-enwere ike ibute ya na nsị onye bu nje ahụ ọbụladị ma nnyocha kwuo na ọ gbakela".

"Ya mere o ji dị mkpa ịkwọ aka ọfụma ma ị gachaa ụlọmposi."

Mana Onajole ekwetaghị na e nwere ike ibute nje coronavirus na nsi.

O kwuru na coronavirus bụ "ọrịa ọwa e si eku ume, (gastro-intestinal tract), ọ bụghị ọrịa nsi nke bụ nsi na nsị na ọnụ (fecal-oral)".