Universities in Nigeria: Ihe mere ọtụtụ mahadum gọọmenti ebidobeghị 'E-learning'

Ebe foto si, Getty Images
Otu akụkọ na-ewu ewu n'ịntaneti bụ nke ụmụ akwụkwọ mahadum na-ajụ ihe mere na amalitebeghị atụmaatụ 'E learning' nke pụtara iji teknụzụ gụọ akwụkwọ n'intaneti.
Onye ụlọọrụ National Universities Commission (NUC) na-achọghị ka akpọpụta aha ya kwuru na ụlọọrụ ha wepụtara atụmaatụ ndị ga-enyere ọtụtụ Mahadum aka ka ha mewe 'E learning' mana o nweghị nke ha hụrụ ndị mahadum ndị a tinyere uchu na ya.
O kwuru na atụmaatụ ndị a gụnyere 'Nigeria Reserch and Education Network' nke otu ụlọakụ mba ụwa bụ 'World Bank' kwadoro, 'Nigeria Universities Network' bụ nke mbụ ha wepụtara nakwa 'Open Education Resources' nke mahadum nwereike ị banye na nkịtị.
Onyeọrụ NUC ahụ kwuru na o nweghị nke ndị mahadum gọọmenti ndị a kwere eji mere ihe.
Ihe ndị na-egbochi mahadum ndị a ịnabata E-learning
Onyeọrụ NUC ahụ kwuru na ụfọdụ mahadum na-ekwukarị na ha nwere teknụzụ nke ha, mere na ha agaghị anabata nke gọọmenti tuziiri ha.
O kwukwara na ụfọdụ na-ekwu na ha enwechaghị akụ na ụba ha ga-eji tinye ya bụ atụmaatụ n'ọrụ.
O bokwara ya bụ ọdachị n'isi ndị ọkammụta ndị megoro okenye, ndị na-achọghị ịnabata teknụzụ maka agụmaakụkwọ makana o nwereike ịhịara ha ahụ.
BBC Igbo ka na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ ndị isi mahadum gọọmenti na Naịjirịa ka ha kwuo ihe mere na ha amalitebeghị 'E learning.'
Onye ọzọ tinyere ọnụ n'okwu a bụ Ọkammụta Felix Chukwuneke, kwuru na ọ bụrụ na amaliteghị 'E-learning' n'oge, ọ ga-ebute nnukwu ọghọm n'agụmaakwụkwọ mahadum na Naịjirịa.
Ọghọm ndị a gụnyere:
- O ga-ebutu ugwu a na-akwanyere agụmakwụkwọ
- Agụmakwụkwọ agaghị na-agụzị ọtụtụ ụmụakwụkwọ agụụ, n'ihi na oteela aka ha nọwara n'ụlọ
- Ụmụakwụkwọ ga-ebido kpawa ọtụtụ agwa jọrọ njọ ga-emetụta obodo nakwa ezinụlọ ha.
- Naịjirịa agaghị enwe ọnụ n'ihe gbasara agụmaakwụkọ na mba ụwa
- Ụbụrụ ndị mmadụ ga-ata akị makana o nweghị ihe ọhụrụ ha na-amụta
Chukwuneke kwuru na o chere na gọọmenti ga-
Akụkọ ka na-abịa.









