Asuu strike: Ndị nkuzi mahadum sị na mkparịtaụka ha na gọọmentị gara ọfụma

Ebe foto si, Federal Ministry of Labour
Ngalaba na-ahụ maka ọdịmma ndị nkuzi mahadum Bekee kpọrọ "Academic Staff Union of Universities" (Asuu) na gọọmentị Naịjirịa nwerela nkwekọrịta n'ime ihe asatọ ha na-arịọ gọọmentị.
Na ngwụcha nzukọ ha mere awa asatọ, Minista na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige sị na obi dị ya mma etu okwu siir gaa.
Ngige sị na he kwenyere n'ihe Asuu kwuru, ma kwuo na ihe fọrọ bụ ka Asuu gaghachi gwa ndị otu ha nkwekọrịta e nwere.
Onyeisi Asuu bụ Biodun Ogunyemi kwenyere na nzukọ ha gara nke ọma ma kwụọ na o nwere ihe ọhụrụ ha ga-eburu ga gwa ndị ọzọ tupu ha alachite n'ihu gọọmentị.
Ọ bụ kemgbe ụbọchị 9 nke Maachị 2020 ka Asuu malitere abụbụ ọrụ a.

Ọ bụ maka ọdịmma ụmụakwụkwọ ka Asuu ji eme abụbụ ọrụ - Ọkammụta Aribodo
Ọkammụta Dennis Aribodo bụ ọkammụta n'ihe banyere ahụike ọha na nje na mahadum Azikiwe di n'Ọka gwara BBC na okwu abụbụ ọrụ Asuu gbara bụ maka ọdịmma mahadum nakwa ndị na-agụ akwụkwọ n'ime ya.
Ọkammụta Aribodo si na ọ bụ eziokwu na ụmụakwụkwọ na-atamu maka etu ha jiri nọdụ n'ụlo kemgbe ọnwa asatọ mana ọ bụ maka ha ka ha jiri na-eme abụbụ ọrụ.
Ọ sị "Ọ bụ maka ọ dị mma ụmụakwụkwọ ka anyị jiri eme ihe a anyị na-eme. Mu onwe m, ụmụ m abụo nọ mahadum ma na-agabiga ihe a."
Ọkammụta Abribodo sị na ọ bụ ewete ego a ga-eji hazie mahadum ọfụma ka ụmụakwụkwọ ga-enwete ohere ịgụ akwụkwọ ọfụma.
Ọ sị "A na-asị na anyị nwere ụmụakwụkwọ dị "half-baked", mana ya bụrụ na mahadum enweghị ihe e ji azụ ụmụakwụkwọ kedụ ihe mere ha ejighị adị ka ha eghere eghe."
Nkwa gọọmentị kwere Asuu
Dịka gọọmentị kwere nkwa na ọ ga-enye ndị Asuu ijeri naịra iri isii na ise iji hụ na ha kwụsịrị abụbụ ọrụ a, Ọkammụta Aribodo sịrị na ego ahụ achịtaghị aja ma ncha.
Ọ sị: "N'afọ 2013, gọọmentị Goodluck Jonathan kwenyere na ọ ga-enye Asuu ijeri narị naịra abụọ kwa afọ. Ha jikwa anyị ihe a kpọrọ "Earned Academic Allowances" (EAA) pụtara ijeri narị naịra anọ na otu (400b) n'afọ 2018. Nke pụtara na a na-ele ijere naịra iri isii na ise anya, onweghi ebe ọ gara ma ncha."
O kwukwara na n'ime ego a gọọmentị sị na ọ ga-enye, ijeri naịra iri anọ bụ nke e ji ha n'ụgwọ site n'afọ 2013.
"Ewepu ego ahụ n'ime nke ha kwere nkwa na ha ga-enye ugbua, ọ fọdụ ijeri naịra iri abuọ n'ise. ijeri naịra iri abụo n'ise mahadum karịrị 70 ga-eke."
'Gọọmentị eweghị agụmakwụkwọ wee mkpa'

Ebe foto si, Getty Images
Ọkammụta Aribodo sị na ihe mere Asuu jiri kwụsie ike bụ makana ha na-ahụ eme gọọmentị na-enye ngalaba ndị ọzọ enyemaka.
Ọ sị: "Gọọmentị nyere ndị ọkụ latrịk aka, nye ndị ụlọakụ. Ndị niile bụ ụlọọrụ ndị nkịtị nwe, mana ya ruo n'okwu akwụkwọ, a sị na ego adịghị."
'Ọ bụghị maka IPPIS ka anyi jiri nọdụ abụbụ ọrụ'
Dịka ọfụdụ ndị mmadụ na-ekwu, ọ bụ maka atụmatụ "Integrated Payroll and Personnel Information System" (IPPIS) gọọmentị hibere iji na-akwụ ndị ọrụ gọọmentị ụgwọ mere Asuu jiri na-eme abụbụ ọrụ.
Mana Ọkammụta Aribodo sị na ha nọbu n'abụbụ ọrụ nke ịdọ aka na ntị tupu gọọmentị ewepụte IPPIS.
Ọ sị: "Ọ bụghị maka ihe mere anyị jiri nọdụ abụbụ ọrụ, mana anyị nwekwara ihe na-arụ ọrụ dịka ya anyị hibere nke gọọmentị nwereike iji na-akwụ ndị mmadụ ụgwọ."
Ọ sị na otu ihe mere ha ji agbajọ IPPIS bụ makana ụfọdụ mmadụ anaghị enwete ụgwọ ọnwa ha maka IPPIS a.
Nkwekọrịta gọọmentị na Asuu nwere bụ na a ga-ewepu ha na IPPIS na nwamgbenta.
Okammụta Aribodo boro ebubo na IPPIS abụghị nke Naịjirịa mana ASUU wetere nke ha bụ "Transparency and Accountability Solution" (UTAS).
Ka ọ kwụ ugbua, Ọkammụta Aribodo sị na ha na gọọmentị nwere mkaprịtaụka na Fraịde bụ ụbọchị 27 nke afọ 2020, bụ oge ha ga-amara etu eke ga-esi nyaa anwụ.










