Ị ma ihe mmanụ agbịdị merela n'ala Ogoni? Lee ahụhụ ndị mmadụ na-ata

Ebe foto si, Jacob Silberberg
Oge mmanụ na-apụta n'ime ala na Bomu gbawara maka ngwa ọrụ na-adịghị arụ ọrụ nke ọma n'ime okpuru ọchịchị Gokana nke Rivas steeti, ọkụ ji oge karị otu ọnwa nwe gbaa.
Ọ ka o mesiri ka ndị ụlọọrụ Shell biara ka ha menyụọ yabụ ọkụ na kwa hichaa ebe a mmanụ kwafuru.
Afọ iri agafeela kemgbe ha hichara ebe a, mana mmanụ agbịdị ka na-ehi n'ala ahụ.

Onye ntaakụkọ BBC Pidgin bụ Karina Igonikon gara ileta ebe a, we hụkwa na akwụkwọ ndụ anaghị enwe ike ito n'ala ahụ nakwa ebe niile a na-esi mmanụ agbịdị.
Onye chiburu dịka onyeisi ndị otu kpọrọ onwe ha 'Survival of Ogoni People (MOSOP) na Bekee bụ Ledum Mitee gwara onye ntaakụkọ BBC Pidgin na oge mberede a mere n'afọ 2008, ndị ọrụ Shell jiri aja e si ebe ọzọ kpota we kpuchie ebe a.
Mana ka ntịtị oge gafere, mmanụ a bidoro na-ehi.
O kwuru na, "Oge mmanụ a kwafuru n'afọ 2009, ọ banyere n'osimiri, n'ebe dị ka Kidaro na K-Dere, mmanụ mebiri ebe azụ biri na kwa gbuo osisi puru na mmiri."
"Ndị mmadụ anaghị enwe ike igbu azụ na mmiri ọ bụ sọọsọ mmanụ agbidi ka ị ga-ahụ"

BBC Pidgin gbara Shell ajụjụ ọnụ maka okwu a, mana ọnụ na-ekwuchitere Shell bụ Joseph Obari kwuru na ha ahụbeghị akụkọ ọbụla gosiri na mmanụ agbịdị na-ehi n'ụmị 27/52 n'afọ 2008.
O kwukwara na ndị Shell rụrụ ọrụ ndozi na-ebe a maka mmanụ hiri n'afọ 2009 na 2010, na kwa na ngalaba akpọrọ National Oil Spill Detection and Response Agency NODSRA enyochaala ebe a na kwa ebe a enweghị nsogbu ọbụla. O kwuru na mmanụ hiri na Bodo abanyeghị na oshimiri nke Kidaro.

Ledum Mitee kwuru na okwu ndị Shell na-ekwu maka idozi ala bụ asị maka na onweghị ihe di n'ala gosiri na ha na-eche echiche ala ahụ.
Mitee kwuru na ndị na-egbu azu na K-Dere ekpeela Shell n'ụlọikpe kemgbe afọ 2009 oge mmanụ a hiri na Bido mana ala ahụ enwegbeghị mmeri ọbụla n'ikpe a.
O kwuru na n'ime akụkọ ngalaba kporọ onwe ha 'United Nations Environment Programme'(UNEP) dere ha kwuru na onye ọbụla egwula mmiri ahụ maọbụ gbuo azụ na mmiri ahụ.
O kwukwara na maka ihe a mere mmiri ha, ndụ ha abụghị ka ọ sị dị ọzọ.











