Presidential Election 2019: Ihe ndị anyị mụtara na ntuliaka Naịjirịa

Man reads newspaper announcing election result in Kano, Nigeria

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Mr Buhari's victory was front-page news in Nigeria

Onyeisiala Muhammadu Buhari abanyela agba afọ anọ ọzọ dịka onyeisiala.

Onye ya na ya na-azọ ihe bụ Atiku Abubakar akpọọla ntuliaka ahụ "wuruwuru" ma kwuo na ọ ga-agbagha ya n'ụlọikpe.

Lee ihe ise anyị mụtara na ntuliaka nwere ọtụtụ ntụpọ.

1. Ọ bụ ọpụrụiche...n'ihe adịghị mma

Naanị otu ụzọ n'ụzọ atọ n'ọnụọgụgụ ndị denyere aha (nde 73) ịtụ vootu, pụtara ya bụ ntuliaka.

Ọnụọgụgụ nke afọ 2019 kachasị pee mpe n'ime afọ iri abụọ kemgbe Naịjirịa bidoro ije ọchịchị onyekwuouche ya.

Etu ndị mmadụ siri tuo vootu na ntuliaka 2019

2. Buhari ka bụ ibu anyị danda na mpaghara ugwu Naịjirịa

Atiku Abubakar na-ekwu na nrụrụaka na-arị ibe ya elu na ngụkọ vootu si na ntuliaka ahụ.

O kwuru na o doghi anya na ọnụọgụgụ ndị pụtara ịtụ vootu n'Akwa Ibom bụ steeti PDP a ma ama erughi pasentị iri ise.

Mana Buhari nwere nkwado n'ugwu Naịjiria ebe a na-ahụ ya dịka mmadụ ọha aka ya kwụ ọtọ.

Ọnụọgụgụ gosiri pasenti ndị denyere aha ma tuo vootu na ntuliaka 2019.

3. Okwu nchekwa akwụsịghị ndị na-eso Buhari ịpụta kwado ya.

Ihe ọzọ Maazị Abubakar tinyere ọnụ na ya bụ etu ụfọdụ ebe n'ugwu awụsa nwere nsogbu nchekwa siri nwee ọnụọgụgụ ka nkụ na ntuliaka a.

Borno na Yobe bụ steeti abụọ ndị APC nwereike ịkpọ nke ha nakwa n'agbanyeghi na okwu Boko Haram achụsasịala ihe ruru mmadụ nde abụọ, ha pụtara n'igwe mee ntuliaka.

Ngalaba Inec haziri ọnọdụ ka mmadụ narị puku anọ bụ ndị gbara ọsọndụ nwee ike tụọ vootu.

Onye na-arị elu ọgba aja

Ebe foto si, AFP

4. Ndọtị adọtịrị ntuliaka 2019 metụtara Atiku na Buhari nke ukwu

Cheta na Inec dọtịrị ntuliaka a otu izuụka ka ọ fọdụrụ elekere asatọ tupu ntuliaka ebido.

Aha onyonyo, Nigeria Election 2019: 'Agaghị m atụ vootu makana atụọla ya atụọ'

Nke a mere na ọ bụghị mmadụ niile mere njem ịtụ vootu na mbụ mere njem ahụ ọzọ, nke nwereike ịmetụta ọnụọgụgụ ndị na-akwado Buhari na Atiku.

5. Ọ dịka igwe ntuliaka nke ọkụ latrik a ga-aka mma

Igwe kad rida

Ebe foto si, Getty Images

Ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n'okwu akọwaala na igwe ntuliaka nke ọkụ latrik emeela ka nrụrụaka raa ahụ.

Akụkọ kwuru na igwe ntuliaka ahụ arụghị ọrụ dịka e si tụọ anya, mana ụfọdụ kwenyere na ọ ga-enye aka ibelata nrụrụaka.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: