Presidential Election 2019: Ndigbo bi n’Okota na Oshodi chị obi ha n’aka
Udo alọghachịla n'Oshodi na Okota dika Ndịgbo bi n'Oshodi nakwa ndị na-azụ ahịa ebe ahụ pụtara gawa mkpa ha.
N'ụzọ ụtụtụ Mọnde bụ ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị, ọgbaghara dapụtara n'Ahịa Oshodi dịka ndị agboro na ndị ntorobia ji mma na osisi wakpoo ma chụsasia Ndigbo na-ere ahịa.
Oge BBC Igbo rutere n'ehihie Mọnde, ọtụtụ n'ime ha emepeela ahịa ha mana egwu ekweghi ụfọdụ mepee, ebe ụfọdụ na-arụzi ihe ndị e mebiri.
Mana Eze Ndigbo Oshodi-Isolo bụ Reuben Ibeakama, kwuru na ya na ndị ndu obodo mpaghara ahụ akpaala udo makwa ndị ahịa ka ha gaa gbapee ahịa ha.
Ọnụ na-ekwuru APC na Legọs bụ Joe Igbokwe kwuru na aka ndị ndu pati ahụ na Legọs adịghị n'ọgbaghara ahụ.
Igbokwe sịrị n'aka ndị ndu APC adịghị n'ihe mere n'Oshodi -Joe Igbokwe
"O nweghị ezigbo mmadụ ga-asị ha ga-eme ihe a ha na-eme."
"Ọ bụghị iwu na ị ga-atụ nyere otu pati. Ọ bụ ọchịchị onyekwuouche ya ka a noọ na ya."
N' Ọkọta, ọtụtụ ọdọahịa dị nso na Baba Ewe, ebe ndị agboro kpara ike ụbọchị ntuliaka agbapeghị n'ihi egwu.

Ndị BBC gbara ajụjụ kwuru na egwu ka na- atụ ha dịka a mabeghị mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala e mere.
N'aka nke ọzọ, otu Massob akatọọla ike ndị agboro kpasoro Ndigbo na Legos.
N'akwụkwọ ozi ha nyere ndị ntaakụkọ nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Samuel Edeson binyere aka, Massob kwuru na ọ bụ ihe mwute na a na-ebuso Ndigbo agha n'ihi ihe gbasara ndọrọndọ ọchịchị na agbanyeghị na oku otu Afenifere kpọrọ ndị Yoroba ka ha kwụsị ịlụso Ndigbo bị na Legọs ọgụ kwụsị.