George Weah ezutela Buhari n'Abuja

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Weah bịara zute Buhari

George Weah na Muhammadu Buhari

Ebe foto si, BashirAhmad

Onyeisiala mba Liberia bụ George Weah bịara zute onyeisiala Muhammadu Buhari ụbọchị Tọọzde n'obi gọọmenti dị n'Abuja.

Dịka onye nnyemaka na okwu gbasara soshal midia nke onye isiala siri kwụpụta n'igwe Twitter, onyeisiala mba abụọ ahụ nwere mkparịtaụka n'okwu gbasara mmekọịta mba abụọ ahụ dịka o siri gbasa nchekwa na akụnaụba.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

A họpụtala Chiji Collins dịka onyeisi ụlọomeiwu Imo steeti

Ụlọomeiwu Imo steeti

Ndịomeiwu ọhụrụ na steeti Imo ahoputala Maazi Chiji Collins dịka olu na-ekwuru ha.Nwa amadi a, bụ onye na-anọchite anya okpuruọchịchị Isiala Mbano nke steeti ahụ. A họpụtara ya na-enweghị onye mara ya aka n'ihu.Nke a bụ nke ugboro abụọ ọ na-aga n'ụlọomeiwu ahụ dịka ahọpụtachara ya nke mbụ n'afọ 2015.

Uloomeiwu a họpụtakwara Okechukwu Onyekanma, bụ onye na-anọchite anya Mbaitoli nke steeti ahụ dịka osote ya.

Onye ọchịehi ebepụla isi nwaagbọghọ n'Ekiti

Mma

Ebe foto si, Getty Images

Obodo Ilasa Ekiti dị n'Ekiti Steeti nọ n'ọgbaghara ugbua n'ihi ọnwụ otu nwaagbọghọ onye ọchịehi bepuru isi maka na ọ jụrụ ịlụ ya.

Onye ọchịehi a a na-akpọbeghi aha ya chechiri nwaaghọghọ ahụ n'ụzọ ebe ọ gara ịkụte mmiri ma bepu ya isi na Tuzde.

Onyeisi obodo ahụ bụ Ajayi Omolagba sị na onye ọchịehi ahụ dị na mbụ kụchie nwaghọghọ site n'aka ezinaụlọ ya dịka iwu ndị Fulani si dị.

Mana ndị ezinaụlọ nwagbọghọ ahụ jụrụ ịlụnye ya nwoke ọchịehi ahụ nke mere o ji gbuo nwaagbọghọ ahụ.

Ndị uweojii Ekiti Steeti kwuru na nke a mere eme, na ha anwụchiela nwoke ahụ site na kepukepu ha nwetere.

Ọkụ gbara ụlọahịa na Port Harcourt

Ụlọahịa dị na Portharcourt

Ebe foto si, Portharcourt Mall

Gọmentị River steti etịnyela ọnụ na ya bụ ọkụ mgbara n'ụlọahịa Port Harcourt Shopping Mall.

Odeakwụkwọ steeti ahụ bụ Tammy Danagogo gwara ometutara dere jụụ na ha ga-emezị ya bụ ụlọahịa ka ndị mmadụ malite azụmahịa taa bụ tọzde.

Atọọrọ onyeisi obodo na Katsina

onye ọchịehị na ehi ya.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị ọchịehi egbuola ọtụtụ mmadụ na Benue na steeti ndị ọzọ dị na Naịjirịa

Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na ndị ntọ atọrọla otu onyeeze na Garin Labo dị Kastina steeti.

onyeeze ahụ nọ na ugbo ya mgbe ndị ntọ ahụ jị ọgbatumtum bịa ọgụ.

N'ofesi

Ụgbọelu onyeisiala Mexico

Ebe foto si, Getty Images

Ụnụ anụla nee na onyeisiala mba Mexico bụ Andres Obrador ekwusiela ike na ya ga- ere ụgbọelu onyeisiala were buo agha gbasara ndị obodo ya ịgbafe mba Amerika n'nzuzo.

Obrador sị na ya ga na-agbazị ụgbọelu ọha iji hụ na ya mejuputara nkwa ya kwere maka nha mba America chọrọ ịda ndị be ha.

N'egwuregwu

Eyimba FC

Ebe foto si, @EnyimbaFC

Nkọwa foto, Enyimba FC nwetara ihe nrite dịka 'otu kachasị agba' na mpaghara Afrịka n'afọ 2003

N'egwuruegwu, Enyimba eburula iko Nigeria Premier league nke ụgbọrọ asatọ ha site n' iji ọkpụ goolo atọ meri Akwa United ụnyaahụ.

Enyimba ji akara iri na abụọ n'egwuregwu ise ha gbara, ebe Reuben Bala, Stanley Dimgba na Abdulrahman Bashir nyeere Enyimba goolu.

Gee akụkọ ndị a ebe a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile